Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 4:13 - Bible Nso

13 dika orú nnù uzọ ise, ndi ejikere nke usu-ndi-agha, gabigara n'iru Jehova ibu agha, rue ala ihe nādighi nke Jeriko.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ (40,000), ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.

See the chapter Copy




Joshua 4:13
11 Cross References  

Usu-ndi-agha ndi Kaldea we chua eze n'azu, rue ya aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko: ma usu-ndi-agha-ya nile siri n'ebe ọ nọ b͕asasia.


ma Chineke dughariri ndi Israel, n'uzọ ọzara, n'uzọ Oké Osimiri Uhie: umu Israel chiri ihe-ekike-agha si n'ala Ijipt rigoputa.


Usu-ndi-agha nke ndi Kaldea we chua ha n'azu; rue Zedekaia aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko: ha we jide ya, me ka ọ rigokuru Nebukadreza, bú eze Babilon, rue Ribla n'ala Hemat, o we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ.


Usu-ndi-agha ndi Kaldea we chua eze n'azu, rue Zedekaia aru n'ala ihe nādighi nke Jeriko; ma usu-ndi-agha-ya nile siri n'ebe ọ nọ b͕asasia.


ma ayi onwe-ayi gējikere onwe-ayi je ọsọsọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gēme ka ha ba n'ebe-ha: ma umu-ntakiri-ayi gēbi n'obodo ndia ewusiri ike n'ihi ndi bi n'ala ahu.


Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa.


M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.


Umu Reuben, na umu Gad, na nkera ebo Manase, we gabiga n'iru umu Israel, chiri ihe-ekike-agha, dika Moses gwara ha okwu:


N'ubọchi ahu ka Jehova mere Joshua ka ọ di uku n'anya Israel nile; ha we tua egwu ya, dika ha turu egwu Moses, ubọchi nile nke ndu-ya.


Umu Israel we ma ulo-ikwū-ha na Gilgal; ha we me ememe ngabiga n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, n'ala ihe nādighi nke Jeriko.


Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa.


Follow us:

Advertisements


Advertisements