Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 4:12 - Bible Nso

12 Umu Reuben, na umu Gad, na nkera ebo Manase, we gabiga n'iru umu Israel, chiri ihe-ekike-agha, dika Moses gwara ha okwu:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu.

See the chapter Copy




Joshua 4:12
9 Cross References  

ma Chineke dughariri ndi Israel, n'uzọ ọzara, n'uzọ Oké Osimiri Uhie: umu Israel chiri ihe-ekike-agha si n'ala Ijipt rigoputa.


Nke umu Gad, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha;


ma ayi onwe-ayi gējikere onwe-ayi je ọsọsọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gēme ka ha ba n'ebe-ha: ma umu-ntakiri-ayi gēbi n'obodo ndia ewusiri ike n'ihi ndi bi n'ala ahu.


M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.


Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu, N'ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu; Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia, Ezi omume nke Jehova ka o mere, Na ikpé-Ya nile n'ebe Israel nọ.


Ndinyom-unu na umu-ntakiri-unu na anu-ulo-unu gānọdu n'ala ahu nke Moses nyere unu n'ofè Jọdan; ma unu onwe-unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, chiri ihe-ekike-agha, ndi-dike nile, bú dìnkpà, unu gēye-kwa-ra ha aka;


O rue, mb͕e ndi Israel nile gabigasiri, na ib͕e Jehova gabigara, ya na ndi-nchu-àjà, n'iru ndi Israel.


dika orú nnù uzọ ise, ndi ejikere nke usu-ndi-agha, gabigara n'iru Jehova ibu agha, rue ala ihe nādighi nke Jeriko.


Follow us:

Advertisements


Advertisements