Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 3:6 - Bible Nso

6 Joshua we gwa ndi-nchu-àjà okwu, si, Bulienu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu-ahu, gabiga n'iru ndi Israel. Ha we bulie ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, we nēje n'iru ndi Israel.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel.

See the chapter Copy




Joshua 3:6
11 Cross References  

Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi-nchu-àjà we bulie ib͕e ahu.


Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi Livai we bulie ib͕e ahu.


Onye-ntipú ahu arigowo n'iru ha: ha etipúwo, we gabiga rue ọnu-uzọ-ama, pua na ya: eze-ha agabigawo kwa n'iru ha, Jehova kwa n'isi ha.


Ha we si n'ugwu Jehova bulie ije-ha je ije ubọchi atọ; ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova nēbuli kwa ije n'iru ha ije ubọchi atọ, ileputara ha ebe izu-ike


Ma asi na I me ka ndi nka nwua dika otù onye, mba nile ndi nuworo akukọ bayere Gi gēkwu kwa, si,


n'ebe Jisus batara n'ihi ayi dika onye nēbu uzọ b͕a ọsọ, ebe emere Ya ka Ọ buru onye-isi-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi dika usoro nke Melkizedek si di.


ha we nye ndi Israel iwu, si, Mb͕e unu nāhu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ka ha nēbu ya, unu onwe-unu gēsi kwa n'ebe unu nọ bulie ije, we nējeso ya.


Joshua we si ndi Israel, Donu onwe-unu nsọ: n'ihi na echi ka Jehova gēme ihe-ebube di iche iche n'etiti unu.


Jehova we si Joshua, Ta ka M'gāmalite ime ka i di uku n'anya Israel nile, ka ha we mara na otú M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi.


Joshua nwa Nun we kpọ ndi-nchu-àjà, si ha, Būrunu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, ndi-nchu-àjà asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e Jehova.


Follow us:

Advertisements


Advertisements