Joshua 3:16 - Bible Nso16 na miri ahu nke nēsi n'elu rida guzoro, we bilie n'otù obo, n'ebe di anya nke-uku, n'Adam, bú obodo nke di n'akuku Zaretan: ebìpusi-kwa-ra miri nke nērudata rue osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú: ndi Israel we gabiga na ncherita-iru Jeriko. See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko. See the chapter |
Gini mere onye ọ bula adighi mb͕e M'biara? gini mere onye-ọziza adighi mb͕e M'kpọrọ òkù? ọ̀ bu na akam dikara nkpunkpu ma-ọli ib͕aputa? ma-ọbu ọ̀ dighi ike di nimem inaputa? Le, n'ibasi-nba-ikem anameme ka oké osimiri tasia, anameme osimiri ka ha ghọ ọzara: azù-ha nēsì ísì, n'ihi na miri adighi, we nwua n'akpiri-ikpọ-nku.