Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 3:13 - Bible Nso

13 Ọ gēru kwa, mb͕e ọbu-ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e Jehova, bú Onye-nwe uwa nile, gēzu ike nime miri Jọdan, na agēbipu miri Jọdan, bú miri nke nēsi n'elu rida; ha gēguzo kwa n'otù obo.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile zọnyere ụkwụ na Jọdan, mmiri Jọdan nke si nʼebe elu ya na-arịdata ga-akwụsị ịsọ, guzoro dịka mgbidi.”

See the chapter Copy




Joshua 3:13
13 Cross References  

Jehova, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube: n'ihi na ihe nile di n'elu-igwe na n'uwa bu nke Gi; Jehova, Gi nwe ala-eze, Gi bu kwa Onye anēweli elu iburu ihe nile onye-isi.


Ọ nāchikọta miri oké osimiri dika obo-ihe: Ọ nētiye ob͕u-miri n'ulo-àkù di iche iche.


Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi: Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ.


O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga; O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.


Ewere iku-ume nke oghere-imi-Gi me ka miri tua obo, Nrurù-miri guzoro onwe-ha ọtọ dika obo; Ob͕u-miri raruru aruru n'obi oké osimiri.


N'ihi na di-gi bu Onye meworo gi; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: ọzọ, onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel; Chineke nke uwa nile ka anākpọ Ya.


I chiriwo inyinya-Gi zọ ije n'oké osimiri, Bú obo nke ọtutu miri.


Ọ si, Ndia bu umu-ndikom abua nke manu ọhu, ndi nēguzo n'akuku Onye-nwe uwa nka nile.


Le, ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Onye-nwe uwa nile nāgabiga n'iru unu nime Jọdan.


unu gāsi kwa ha, N'ihi na ebipuru miri Jọdan n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova; mb͕e ọ gabigara Jọdan, ebipuru miri Jọdan: nkume ndia gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ncheta rue mb͕e ebighi-ebi.


Follow us:

Advertisements


Advertisements