Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 3:11 - Bible Nso

11 Le, ib͕e ọb͕ub͕a-ndu nke Onye-nwe uwa nile nāgabiga n'iru unu nime Jọdan.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile ga-agabiga nʼihu unu banye nʼime Jọdan.

See the chapter Copy




Joshua 3:11
15 Cross References  

Jehova, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube: n'ihi na ihe nile di n'elu-igwe na n'uwa bu nke Gi; Jehova, Gi nwe ala-eze, Gi bu kwa Onye anēweli elu iburu ihe nile onye-isi.


Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi? Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.


Jehova nwe uwa na ùjú-ya; Elu-uwa dum madu bi na ndi bi nime ya.


Ugwu nile b͕azepuru dika wax n'iru Jehova, N'iru Onye-nwe uwa nile.


Ndim, ndi nāchi ha n'ihe-ike bu nwatakiri, ndinyom achiwo kwa ha. Gi ndim, ndi-nduzi-gi nēme ka i wagharia, ha elodawo kwa uzọ nke okporo-uzọ-gi nile.


N'ihi na di-gi bu Onye meworo gi; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: ọzọ, onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel; Chineke nke uwa nile ka anākpọ Ya.


Ònye nāgaghi-atu egwu Gi, Eze mba nile? n'ihi na Gi ka o kwesiri: n'ihi na n'etiti ndi-amam-ihe nile nke mba nile, na n'ala-eze nile ha, ọ dighi onye di ka Gi ma-ọli.


Bilie, zọcha, gi ada Zaion: n'ihi na mpi-gi ka M'gēme ka ọ ghọ ígwè, ọ bu kwa ukwu-gi ka M'gēme ka ha ghọ ọla: i gāzọpia kwa ọtutu ndi di iche iche: M'gēwezuga kwa urù-ha nye Jehova, wezuga kwa àkù-ha nye Onye-nwe uwa nka nile.


Onye di egwu ka Jehova gābu n'imegide ha: n'ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n'ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile.


Jehova gāghọ kwa eze elu-uwa nile: n'ubọchi ahu ka Jehova gādi otù, aha-Ya gādi kwa otù.


Ọ si, Ndia bu umu-ndikom abua nke manu ọhu, ndi nēguzo n'akuku Onye-nwe uwa nka nile.


Mọ-ozi ahu we za, sim, Ndia bu ifufe anọ nke elu-igwe, ndi nēsi n'iguzo onwe-ha n'iru Onye-nwe uwa nka nile pua.


Ma i mawo ta, na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye nāgabiga n'iru gi dika ọku nēripia eripia; Ya onwe-ya gēkpochapu ha, Ya onwe-ya gēme kwa ka ha ruru ala n'iru gi: i we napu ha ala-ha, me kwa ka ha la n'iyì ngwa ngwa, dika Jehova gwaworo gi okwu.


Ọ gēru kwa, mb͕e ọbu-ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e Jehova, bú Onye-nwe uwa nile, gēzu ike nime miri Jọdan, na agēbipu miri Jọdan, bú miri nke nēsi n'elu rida; ha gēguzo kwa n'otù obo.


Follow us:

Advertisements


Advertisements