Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 23:8 - Bible Nso

8 kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gārapara n'aru, dika unu meworo rue ta.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Kama raparanụ nʼahụ Onyenwe anyị Chineke unu dịka unu mere ruo taa.

See the chapter Copy




Joshua 23:8
11 Cross References  

O we rapara Jehova n'aru, o sighi n'iso Ya wezuga onwe-ya, o we debe ihe nile O nyere n'iwu, bú nke Jehova nyere Moses n'iwu.


onye, mb͕e ọ biaruru, mb͕e ọ hu-kwa-ra amara Chineke, ọ ṅuria; o we riọ ha nile, ka ha zube n'obi-ha inọgide n'ebe Onye-nwe-ayi nọ:


Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; Ya ka i gēfè, Ya ka i gārapara n'aru, aha-Ya ka i gēji ṅu iyi.


N'ihi na ọ buru na unu ejisie ike idebe ihe nile a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, ka unu we me ya; ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, ije ije n'uzọ-Ya nile, na irapara n'aru Ya;


Jehova, bú Chineke-unu, ka unu ganējeso n'azu, Ya ka unu gātu egwu, ihe nile O nyere n'iwu ka unu gēdebe, olu-Ya ka unu gēge nti, Ya ka unu gēfè òfùfè, Ya ka unu gārapara n'aru.


Ma agēme ka onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu, nwua; n'ihi na o kwuworo okwu nwezuga megide Jehova, bú Chineke-unu, (Onye nēme ka unu si n'ala Ijipt puta, Onye nāb͕aputa kwa gi n'ulo ndi-orù), ka o we duhie gi n'uzọ ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu ije ije nime ya. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


Ma unu onwe-unu ndi nārapara n'aru Jehova, bú Chineke-unu, unu nādi ndu ta, unu nile.


Dika mba ahu ndi Jehova nēme ka ha la n'iyì n'iru unu, otú a ka unu gāla n'iyì; n'ihi na unu egeghi nti n'olu Jehova, bú Chineke-unu.


Nání, lezienu anya nke-ọma ime ihe enyere n'iwu na iwu ahu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na ije íjè n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na irapara n'aru Ya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè.


ka unu ghara ibà nime mba ndia, ndi fọduru n'etiti unu; unu ehota-kwa-la aha chi nile ha, unu eme-kwa-la ka ewere ha ṅua iyi, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha:


Jehova nānapu kwa mba uku nke nwere ume ala-ha n'iru unu: ma unu onwe-unu, ọ dighi nwoke ọ bula guzoworo n'iru unu rue ta.


Follow us:

Advertisements


Advertisements