Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 23:7 - Bible Nso

7 ka unu ghara ibà nime mba ndia, ndi fọduru n'etiti unu; unu ehota-kwa-la aha chi nile ha, unu eme-kwa-la ka ewere ha ṅua iyi, unu efè-kwa-la ha òfùfè, unu akpọ-kwa-la isi ala nye ha:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Lezienụ anya ka unu na mba ndị a fọdụrụ nʼala a ghara inwe mmekọ ọbụla. Unu akpọtụkwala chi ha niile aha. Unu aṅụkwala iyi nʼaha ha, maọbụ fee ha ofufe, maọbụ kpọọ isiala nye ha.

See the chapter Copy




Joshua 23:7
23 Cross References  

ha we fè arusi di iche iche òfùfè, nke Jehova siri ha, Unu emela ihe a.


Ka Jehova b͕aghara orù-gi ihe a; mb͕e onye-nwem nābà n'ulo Rimon ikpọ isi ala n'ebe ahu, mb͕e ya onwe-ya nādabere kwa n'akam, m'we kpọ isi ala n'ulo Rimon, mb͕e m'kpọrọ isi ala n'ulo Rimon, biko, ka Jehova b͕aghara orù-gi n'ihe a.


Ma ọ buru na unu onwe-unu alaghachi azu, we rapu ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, nke M'tiyeworo n'iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha:


Ihe-nb͕u-ha gāba uba, bú ndi were chi ọzọ n'ọnọdu Jehova: M'gaghi-awusi àjà-ihe-ọṅuṅu-ha nke ọbara, M'gaghi-eburu kwa aha-ha n'elu eb͕ub͕ere-ọnum.


gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;


Ma n'ihe nile M'siworo unu lezienu anya: unu ehota-kwa-la aha chi ọ bula ọzọ, ka aghara kwa inu ya n'ọnu-gi.


Ha agaghi-ebi n'ala-gi, ka ha we ghara ime ka i mehie megidem: n'ihi na ọ buru na i fè chi-ha, ọ ghaghi iburu gi ọnyà.


Abàla n'okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, Aga-kwa-la n'iru n'uzọ ndi ọjọ.


Ọ gēru kwa, ọ buru na ha amuta uzọ nile nke ndim nke-ọma, iji aham ṅu iyi, si, Jehova nādi ndu; dika ha zíri ndim iji Beal ṅu iyi; agēwuli kwa ha dika ulo n'etiti ndim.


M'gēsi kwa aṅa b͕aghara gi? umu-gi arapuwom, we were ihe nābughi chi ṅu iyi: mb͕e M'mere ka ha rijue afọ, ha we kwa iko, ọ kwa n'ulo nwanyi nākwa iko ha nēdo onwe-ha n'usu ndi nāpunara madu ihe.


M'gēwezuga kwa aha nile nke Bealim n'ọnu-ya, agaghi-ehota kwa ha n'aha-ha ọzọ.


na ndi nākpọ isi ala nye usu ihe nile di n'elu-igwe n'elu-ulo nile; na ndi nākpọ isi ala, ndi nāṅuru Jehova iyi, ndi ji kwa Malkam aṅu iyi;


na Nebo, na Beal-meon, (ma ab͕anwere aha-ha,) na Sibma: ha we were aha kpọkwasi obodo ha wuru aha.


Ma ọ buru na unu anapughi n'aka ndi bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu; ọ gēru kwa na ndi unu kwere ka ha fọdu site na ndi ahu gāghọ kwa obi-ogwu n'anya-unu, ghọ kwa ogwu n'akuku-unu, ha gākpab͕u kwa unu n'ala ahu nke unu onwe-unu nēbi nime ya.


Unu ekwela ka eduhie unu: Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma.


unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya;


Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; Ya ka i gēfè, Ya ka i gārapara n'aru, aha-Ya ka i gēji ṅu iyi.


Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; ọ bu kwa Ya ka i gēfè òfùfè, ọ bu kwa aha-Ya ka i gēwere ṅu iyi.


Unu ejesola chi ọzọ, ndi sitere na chi nke ndi ahu ndi nọ unu buruburu;


Ma ọ buru na unu alaghachi ma-ọli, we rapara n'aru ndi fọduru nke mba ndia, bú ndia fọduru n'etiti unu, unu na ha ewe lurita nwunye, unu ewe bakuru ha, ha ewe bakuru kwa unu:


kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gārapara n'aru, dika unu meworo rue ta.


Follow us:

Advertisements


Advertisements