Ma nēzenu onwe-unu, ka aghara iwere imebiga-ajọ-ihe-ókè, na iṅubiga-manya-ókè, na ncheb͕u nke ndu a, bob͕u obi-unu ma eleghi anya, ubọchi ahu we biakwasi unu na mberede dika ọnyà;
n'ihi na mu onwem nēnye gi iwu ta ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ije ije n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na ukpuru-Ya nile, na ikpé-Ya nile, ka i we di ndu, ba kwa uba, ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzi kwa gi n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.
ihu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, na ige nti olu-Ya, na irapara n'aru Ya: n'ihi na Ya onwe-ya bu ndu-gi, na ogologo nke ubọchi-gi: ka i we biri n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob, inye ha.
Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;
nēle-kwa-nu anya nke-ọma, ma ọ di onye ọ bula nke nērughi amara Chineke; ka nkpọrọgwụ ilu obula we ghara ipuputa we sob͕ue unu; ewe were nkpọrọgwụ ahu meru ọra madu;
Nání, lezienu anya nke-ọma ime ihe enyere n'iwu na iwu ahu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na ije íjè n'uzọ-Ya nile, na idebe ihe nile O nyere n'iwu, na irapara n'aru Ya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè.
Ma ọ buru na unu alaghachi ma-ọli, we rapara n'aru ndi fọduru nke mba ndia, bú ndia fọduru n'etiti unu, unu na ha ewe lurita nwunye, unu ewe bakuru ha, ha ewe bakuru kwa unu: