Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 22:4 - Bible Nso

4 Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka umu-nne-unu zuru ike, dika Ọ gwara ha okwu: ub͕u a kwa chigharianu, jerue ulo-ikwū-unu n'onwe-unu, rue ala ihe-onwunwe-unu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'ofè Jọdan.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke unu enyela ụmụnna unu mmeri. O meekwala ka ha zuru ike dịka o kwere nkwa na ọ ga-eme. Ugbu a, laghachinụ nʼụlọ unu, laghachikwanụ nʼala unu, ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.

See the chapter Copy




Joshua 22:4
16 Cross References  

Jehova, bú Chineke-unu, Ọ̀ nọyeghi unu? Ọ̀ meghi kwa ka unu zuru ike buruburu? n'ihi na Ọ nyewo n'akam ndi bi n'ala; ebudawo kwa ala n'iru Jehova, na n'iru ndi-Ya.


Ọ si, Irum ganēje, M'gēme kwa ka i zuru ike.


Ayi agaghi-alata n'ulo-ayi, rue mb͕e umu Israel ketaworo, nwoke ọ bula ihe-nketa-ya.


n'ihi na unu akābaghi rue ub͕u a n'izu-ike ahu, na n'ihe-nketa ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.


ayi we were ala-ha, were ya nye ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, n'ihe-nketa.


rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O mere unu, ha onwe-ha we nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha n'ofè Jọdan: unu we laghachi, nwoke ọ bula rue ihe-nnweta-ya, nke m'nyeworo unu.


N'ihi na asi na Joshua mereri ka ha zuru ike, Ọ gaghi-adi nēkwu okwu bayere ubọchi ọzọ mb͕e ihe ndia gasiri.


rue mb͕e Jehova gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O meworo unu, ha we nweta, ọbuná ha onwe-ha, ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye ha: unu we laghachi n'ala nke ihe-nnweta-unu, we nweta ya, bú nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu.


Moses, bú orù Jehova, na umu Israel tib͕uru ha: Moses, bú orù Jehova, we nye ya ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, ka ọ buru ihe-nnweta.


Moses we nye ebo umu Reuben dika ab͕uru nile ha si di.


Ndi Reuben na ndi Gad soro ya nara ihe-nketa-ha, nke Moses nyere ha, n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, dika Moses, bú orù Jehova, nyere ha;


unu arapughi umu-nne-unu ọtutu ubọchi ndia rue ta, ma unu edebewo ihe-ndebe nke ihe Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements