Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 21:8 - Bible Nso

8 Umu Israel we nye ndi Livai obodo ndia na ebe-ita-nri-ha n'ife-nzà, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ya mere, ụmụ Izrel mezuru iwu niile Onyenwe anyị nyere Mosis site nʼikenye ndị Livayị obodo ha ga-ebi, nakwa ebe anụ ụlọ ha ga-ata nri.

See the chapter Copy




Joshua 21:8
11 Cross References  

Simeon na Livai bu nwa-nne; Ihe nke ihe-ike bu mma-agha-ha.


Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n'ihi na ọ di ike; Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n'ihi na o sika ike: M'gēkesa ha nime Jekob, B͕asa kwa ha n'Israel.


Anēfe nzà, Ma n'aka Jehova ka ikpé-ya nile sitere.


Ife-nzà nēme ka ise-okwu kwusi, Ọ bu kwa ndi nwere ume ka ọ nēkewa.


umu Gad na umu Reuben we bia, gwa Moses, gwa kwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gwa kwa ndi-isi nzukọ Israel, okwu, si,


Unu gēketa kwa ala ahu n'ife-nzà dika ab͕uru nile unu si di; ndi bara uba ka unu gēme ka ala-nketa-ha rie nne, ma ndi di ole-na-ole ka i gēme ka ala-nketa-ha di ntà: ebe ọ bula nzà ahu gāmara onye ọ bula, ọ gēnwe ya; dika ebo nile nke nna-unu-hà si di ka unu gēketa.


Obodo ahu gābu-kwa-ra ha ebe ibi nime ha; ebe-ita-nri-ha gādi-kwa-ra anu-ulo-ha, di-kwa-ra àkù-ha, di-kwa-ra anu nile ha.


Unu onwe-unu gēde kwa ala ahu n'akwukwọ n'òkè asa, wetaram akwukwọ ahu n'ebe a: m'gēfe-kwa-ra unu nzà n'ebe a n'iru Jehova, bú Chineke-ayi.


Umu Israel we si n'ihe-nketa-ha nye ndi Livai, dika okwu-ọnu Jehova si di, obodo ndia na ebe-ita-nri-ha.


Umu Merari dika ab͕uru nile ha si di we nwe obodo iri na abua sitere n'ebo Reuben, site kwa n'ebo Gad, site kwa n'ebo Zebulun.


Ha we si n'ebo umu Juda, si kwa n'ebo umu Simeon, nye obodo ndia nke akpọrọ ha n'aha n'ebe a:


Follow us:

Advertisements


Advertisements