Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 21:4 - Bible Nso

4 Ife-nzà we putara ab͕uru nile nke ndi Kohat: umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ndi sitere na ndi Livai, we nwe obodo iri na atọ sitere n'ebo Juda, site kwa n'ebo ndi Simeon, site kwa n'ebo Benjamin, n'ife-nzà.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja.

See the chapter Copy




Joshua 21:4
9 Cross References  

Na nwa-nne-ya nwoke, bú Esaf, onye nēguzo n'aka-nri-ya, bú Esaf nwa Berekaia, nwa Shimea;


Ndia bu kwa aha umu-ndikom Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di; Giashon, na Kohat, na Merari: arọ ndu Livai di ọgu arọ isi na iri na asa.


Amram we lutara onwe-ya Jokebed na nwunye, bú nwa-nne-nwayi nke nna-ya; ọ we muara ya Eron na Moses: arọ ndu Amram di ọgu arọ isi na iri na asa.


Nke Kohat bu ab͕uru ndi Amram, na ab͕uru ndi Izha, na Ab͕uru ndi Hebron, na aburu ndi Uziel: ndia bu ab͕uru ndi Kohat.


Umu Israel we si n'ihe-nketa-ha nye ndi Livai, dika okwu-ọnu Jehova si di, obodo ndia na ebe-ita-nri-ha.


Umu Kohat fọduru we nwe obodo iri sitere n'ab͕uru nile nke ebo Efraim, site kwa n'ebo Dan, site kwa na nkera ebo Manase, n'ife-nzà.


Eleeza nwa Eron we nwua; ha we lìe ya n'ugwu Finehas nwa-ya, nke enyere ya n'ugwu Efraim.


Follow us:

Advertisements


Advertisements