Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 21:10 - Bible Nso

10 ha we diri umu Eron, ndi sitere n'ab͕uru ndi Kohat, ndi sitere n'umu Livai: n'ihi na ha ka ife-nzà mbu diri.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 kenye ndị ikwu Kohat, ndị bụ ụmụ ụmụ Erọn, bụrụkwa ụmụ ụmụ Livayị. Ọ bụ ha ka e bụ ụzọ kenye ihe nketa site nʼife nza.

See the chapter Copy




Joshua 21:10
10 Cross References  

Ma ndia bu ebe-obibi-ha dika ebe-ulo-ikwū nile ha si di n'ókè-ala nile ha: enyere umu Eron, bú ab͕uru ndi Kohat, n'ihi na ha nwere ife-nzà mbu,


Umu-ndikom Kohat kwa; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel: arọ ndu Kohat di ọgu arọ isi na iri na atọ.


Umu-ndikom Kohat kwa dika ab͕uru nile ha si di; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel.


Nke Kohat bu ab͕uru ndi Amram, na ab͕uru ndi Izha, na Ab͕uru ndi Hebron, na aburu ndi Uziel: ndia bu ab͕uru ndi Kohat.


Guta ọnu-ọgugu umu Kohat site n'etiti umu Livai, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di,


Ha we nye ha Kiriat-aba, nna Anak ka Aba ahu bu, (nke ahu bu Hebron,) n'ugwu Juda, ya na ebe-ita-nri-ya nile buruburu ya.


Ife-nzà we putara ab͕uru nile nke ndi Kohat: umu Eron, bú onye-nchu-àjà, ndi sitere na ndi Livai, we nwe obodo iri na atọ sitere n'ebo Juda, site kwa n'ebo ndi Simeon, site kwa n'ebo Benjamin, n'ife-nzà.


Ha we si n'ebo umu Juda, si kwa n'ebo umu Simeon, nye obodo ndia nke akpọrọ ha n'aha n'ebe a:


Follow us:

Advertisements


Advertisements