Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 20:9 - Bible Nso

9 Ndia bu obodo akara àkà bayere umu Israel nile, baye-kwa-ra ọbìa nke nānọ dika ọbìa n'etiti ha, ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu, ghara kwa onwu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọ Israel.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel.

See the chapter Copy




Joshua 20:9
5 Cross References  

Obodo ndia nke unu gēnye, obodo isi nke nb͕abá ka ha gāburu unu.


Obodo isi ndia gāburu umu Israel, buru kwa ọbìa, buru kwa onye bi n'etiti ha, ebe-nb͕abà: ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu.


Ọ gāb͕alaga kwa n'otù nime obodo ahu, guzo n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo ahu, kwue okwu-ya nile na nti ndi-okenye obodo ahu; ha gākpọbata kwa ya n'obodo tiyere onwe-ha, nye ya ọnọdu, ka o we biri n'etiti ha.


O gēbi kwa n'obodo ahu, rue mb͕e o gēguzo n'iru nzukọ Israel ka ekpe ya ikpe, rue ọnwu onye-isi-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu: mb͕e ahu ob͕u-madu ahu gālaghachi, ba n'obodo-ya, ba kwa n'ulo-ya, rue obodo ahu nke o si n'ebe ahu b͕alaga.


N'ofè Jọdan n'akuku Jeriko n'akuku ọwuwa-anyanwu ha nye-kwa-ra Beza n'ọzara n'ala di lari site n'ebo Reuben, na Remot nime Gilead site n'ebo Gad, na Golan nime Beshan site n'ebo Manase.


Follow us:

Advertisements


Advertisements