Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 2:7 - Bible Nso

7 Ndikom ahu we nāchu ha n'uzọ Jọdan rue ngabiga-miri: ha we mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ndi nāchu ha n'azu pusiri.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ya mere, ndị ikom ahụ pụrụ na-achụ ndị nnyopụta ahụ nʼakụkụ ụzọ gara ngabiga Jọdan. Ma ngwangwa ha pụrụ, e mechiri ọnụ ụzọ ama e si abata obodo ahụ.

See the chapter Copy




Joshua 2:7
6 Cross References  

si, Ayi huru ulo-nkpọrọ ka emechisiri ya ike nke-ọma, ayi hu-kwa-ra ndi-nche ka ha nēguzo n'ọnu-uzọ: ma mb͕e ayi meghere, ọ dighi onye ọ bula ayi huru nime ya.


o rue, mb͕e agaje imechi ọnu-uzọ-ama, n'ọchichiri, na ndikom ahu puru: amaghi ebe ndikom ahu jere: chuanu ha ngwa ngwa; n'ihi na unu gēru ha aru.


Ma ya onwe-ya mere ka ha rigo n'elu-ulo, o we zobe ha n'ókpòrò flax, nke edoro n'uso nye ya n'elu-ulo.


Ma tutu ha onwe-ha edina ala, nwayi ahu we rigokuru ha n'elu-ulo;


Gilead we were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzo ije Efraim: o rue, mb͕e ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim siri, Ka m'gabiga, na ndikom Gilead siri ya, Ọ̀ bu onye Efraim ka i bu? Ọ si, É-è;


Ọ si ha, B͕asonum n'azu: n'ihi na Jehova enyewo ndi-iro-unu, bú ndi Moab, n'aka-unu. Ha we soro ya rida, were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzọ ije Moab, ha ekweghi kwa ka nwoke ọ bula gabiga.


Follow us:

Advertisements


Advertisements