Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 2:6 - Bible Nso

6 Ma ya onwe-ya mere ka ha rigo n'elu-ulo, o we zobe ha n'ókpòrò flax, nke edoro n'uso nye ya n'elu-ulo.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 (Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)

See the chapter Copy




Joshua 2:6
17 Cross References  

O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n'ihe-ndina-ya bilie, jegharia n'elu ulo eze: o we si n'elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n'ile anya.


Nwayi nwe-ulo we were ihe-nkpuchi-ya b͕asa ya n'ọnu olùlù-miri ahu, tusa ọka asuru asu n'elu ya; ma ọ dighi ihe amara.


Ègosighi onye-nwem ihe m'mere mb͕e Jezebel b͕uru ndi-amuma Jehova, na ezorom ọgu ndikom ise sitere na ndi-amuma Jehova, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, ogu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha?


o we rue, mb͕e Jezebel bipuru ndi-amuma Jehova, na Obadaia chiri ọgu ndi-amuma ise, zo ha, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha.)


Ma Jehosheba, nwa-nwayi eze, bú Joram, nwa-nne-nwayi Ehazaia, were Joash nwa-nwoke Ehazaia, zupu ya n'etiti umu-ndikom eze ndi anēme ka ha nwua, o were ya na nwayi nēnye ya ara, tiye ha n'ime-ulo nke ihe-ndina; ha we zopu ya n'iru Atalaia, ewe ghara ime ka ọ nwua.


Nwayi ahu we turu ime, mua nwa-nwoke: mb͕e ọ huru ya na nwa mara nma ka ọ bu, o zobe ya ọnwa atọ.


Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.


onye nọ n'elu ulo, ya ghara iridata ikwapu ihe di n'ulo-ya:


Mb͕e i nēwu ulo ọhu, i gēme-kwa-ra elu-ulo-gi ihe-nb͕ochi buruburu, ka i ghara ime ka ọbara di n'ulo-gi, mb͕e madu gēsi na ya da.


N'ihi na unu nwuru anwu, ezowo kwa ndu-unu n'ebe Kraist-ayi nọ nime Chineke.


Mb͕e amuru Moses, ọ bu okwukwe ka ndi muru ya ji zobe ya ọnwa atọ, n'ihi na ha huru na nwatakiri ahu mara nma; ha atughi kwa egwu ihe eze ala ahu nyere n'iwu.


Ma n'uzọ di otù a èsiteghi kwa n'ọlu gu Rehab, bú nwanyi nākwa iko, n'onye ezi omume, mb͕e ọ kpọbatara ndi-ozi ahu, we zipu ha n'uzọ di iche?


o rue, mb͕e agaje imechi ọnu-uzọ-ama, n'ọchichiri, na ndikom ahu puru: amaghi ebe ndikom ahu jere: chuanu ha ngwa ngwa; n'ihi na unu gēru ha aru.


Ndikom ahu we nāchu ha n'uzọ Jọdan rue ngabiga-miri: ha we mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ndi nāchu ha n'azu pusiri.


Ma tutu ha onwe-ha edina ala, nwayi ahu we rigokuru ha n'elu-ulo;


Ma Joshua mere ka Rehab, bú nwayi nākwa iko, na ulo nna-ya, na ihe nile ọ nwere, di ndu; ọ we biri n'etiti Israel, rue ta; n'ihi na o zobere ndi-ozi ahu, ndi Joshua zigara iledo Jeriko.


Follow us:

Advertisements


Advertisements