Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 2:4 - Bible Nso

4 Nwanyi ahu we kuru ndikom abua ahu, zobe ha; o we si, Ọ bu otú a, ndikom ahu bakuterem, ma amaghm ebe ha si bia:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa.

See the chapter Copy




Joshua 2:4
9 Cross References  

Elaisha we si ha, Nka abughi uzọ, nka abughi kwa obodo; sonum je, m'gēme kwa ka unu jekuru nwoke ahu onye unu nāchọ. O we me ka ha je Sameria.


Ndinyom nēle ime we si Fero, N'ihi na ndinyom Hibru adighi ka ndinyom Ijipt; n'ihi na ndi nwere ndu ka ha bu, ha nāmu kwa nwa tutu ndinyom nke nēle ime abiakute ha.


Ma n'uzọ di otù a èsiteghi kwa n'ọlu gu Rehab, bú nwanyi nākwa iko, n'onye ezi omume, mb͕e ọ kpọbatara ndi-ozi ahu, we zipu ha n'uzọ di iche?


Eze Jeriko we zigara Rehab ozi, si, Me ka ha puta, bú ndikom ahu ndi bakutere gi, ndi bara n'ulo-gi: n'ihi na ọ bu ileputa ala nka nile ka ha biaworo.


o rue, mb͕e agaje imechi ọnu-uzọ-ama, n'ọchichiri, na ndikom ahu puru: amaghi ebe ndikom ahu jere: chuanu ha ngwa ngwa; n'ihi na unu gēru ha aru.


Obodo ahu gābu ihe ewezugara nye Jehova, ya onwe-ya, na ihe nile di nime ya: nání Rehab, bú nwayi nākwa iko, gādi ndu, ya onwe-ya na ndi nile ya na ha nọ n'ulo, n'ihi na o zobere ndi-ozi ndi ayi zigara.


Ma Joshua mere ka Rehab, bú nwayi nākwa iko, na ulo nna-ya, na ihe nile ọ nwere, di ndu; ọ we biri n'etiti Israel, rue ta; n'ihi na o zobere ndi-ozi ahu, ndi Joshua zigara iledo Jeriko.


Follow us:

Advertisements


Advertisements