Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 19:32 - Bible Nso

32 Ọ bu umu Naftali ka ife-nzà nke-isi putara, bú umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Ebo nke isii e nyere ihe nketa site nʼife nza bụ ebo Naftalị, dịka ikwu ha si dị.

See the chapter Copy




Joshua 19:32
11 Cross References  

umu-ndikom Bilha, bú nwayi nējere Rechel ozi; Dan na Naftali:


Naftali bu nne-ele arapuworo arapu: Bú onye ahu nke nēnye okwu-ọnu nile di utọ.


Ahimaaz, nime Naftali; onye ahu lu-kwa-ra Basemat nwa Solomon na nwunye:


N'akuku ókè-ala Asha, site n'akuku Iru-anyanwu we rue akuku Ọdida-anyanwu; Naftali, otù òkè.


Nání ọ bu n'ife-nzà ka agēkè ala ahu: dika aha nile nke ebo nile nke ndi bu nna-ha si di ka ha gēketa.


O we rapu Nazaret, bia biri na Kapanaum, nke di n'usọ osimiri, n'ókè-ala Zebulun na Naftali:


O we kwue ihe bayere Naftali, si, Naftali, onye ewere ihe-utọ me ka afọ ju gi, Onye juputa-kwa-ra na ngọzi Jehova: Gi nweta Ọdida-anyanwu na Ndida.


Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.


Ókè-ala-ha we site na Helef, site n'osisi terebinth nime Zaananim, na Adami-nekeb, na Jabneel, rue Lakum; ọpupu-ya we di na Jọdan:


Naftali anapughi kwa ndi bi na Bet-shemesh, na ndi bi na Bet-anat, ala-ha; ha we biri n'etiti ndi Kenean, bú ndi bi na n'ala ahu: ma ndi bi na Bet-shemesh na Bet-anat ghọrọ ndi nēfè ha òfùfè.


O zìe kpọ Berak nwa Abinoam ka o si na Kedesh-naftali bia, ọ si ya, Ọ̀ nyeghi iwu, bú Jehova, Chineke nke Israel, si, Je, dọrọ rue n'ugwu Teboa, chiri kwa n'onwe-gi orú nnù ndikom na nnù ise sitere n'umu Naftali, site kwa n'umu Zebulun?


Follow us:

Advertisements


Advertisements