Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 18:3 - Bible Nso

3 Joshua we si umu Israel, Rùe ole mb͕e ka unu onwe-unu gābu ndi-ume-ngwu ibà inweta ala ahu, nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nyeworo unu?

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ya mere, Joshua jụrụ ụmụ Izrel ajụjụ sị ha, “Ruo ole mgbe ka unu ga-eche tupu unu ekpochapụ ndị niile bi nʼala a, inweta ala Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nyere unu?

See the chapter Copy




Joshua 18:3
15 Cross References  

Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu: Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya.


Ọ nāchọsi ike, ma ọ dighi ihe o nwere, bú nkpuru-obi onye-ume-ngwu: Ma nkpuru-obi nke ndi di nkọ, agēme ya ka ọ ma abuba.


Uzọ onye-ume-ngwu di ka ogige ogwu: Ma okporo-uzo ndi ziri ezi bu uzọ atuliri atuli.


Ihe ọ bula aka-gi nāhu ime, were ike-gi me ya; n'ihi na ọ dighi ọlu, ma-ọbu ichè-èchìchè, ma-ọbu ihe-ọmuma, ma-ọbu amam-ihe, di n'ala-mọ, ebe gi onwe-gi nāla.


N'ubọchi ahu ka agāsi Jerusalem, Atula egwu: gi Zaion, ekwela ka aka-gi abua kuda.


Ọ we pua dika oge hour nke-iri-na-otù, hu ndi ọzọ ka ha nēguzo; ọ si ha, Gini mere unu guzoro n'ebe a ubọchi dum nālughi ọlu?


Unu alula ọlu inata ihe-oriri nke nāla n'iyì, kama inata ihe-oriri nke nānọgide rue ndu ebighi-ebi, nke Nwa nke madu gēnye unu: n'ihi na Onye ahu ka Nna, bú Chineke, kara akàrà.


Idi ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka ndi nka keta ala ahu nke M'ṅuru nna-ha iyi inye ha.


Ma Joshua ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; Jehova we si ya, I ghọwo agadi, ubọchi ndu-gi nāgwu, ma ala nke riri nne nke-uku fọduru inweta.


Ebo asa we fọdu n'etiti umu Israel, ndi anēkeghi ihe-nketa-ha.


Doronu onwe-unu ndikom atọ inọrọ ebo ọ bula: m'gēziga kwa ha, ha gēbili kwa, jegharia n'ala nka, de ya n'akwukwọ dika ihe-nketa-ha si di; ha gābiakutekwam.


Ha si, Bilie, ka ayi rigo kwa imegide ha: n'ihi na ayi ahuwo ala ahu, ma, le, ọ di nma nke-uku: ùnu onwe-unu nāb͕a kwa nkiti? unu adila ume-ngwu ije na ibà inweta ala ahu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements