Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 18:12 - Bible Nso

12 Ókè-ala ha nwere n'akuku Ugwu we site na Jọdan; ókè-ala ahu we rigo rue akuku Jeriko n'Ugwu, rigo kwa n'ugwu n'akuku Ọdida-anyanwu; ọpupu-ya di kwa n'ọzara Bet-even.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Oke ala ha nʼakụkụ ugwu sitere nʼosimiri Jọdan ruo nʼakụkụ ugwu Jeriko. Nʼọdịda anyanwụ o sitere na Jeriko ruo ala ugwu ugwu ahụ niile, ruokwa nʼọzara Bet-Aven.

See the chapter Copy




Joshua 18:12
11 Cross References  

Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n'ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n'ihi nsọpuru-ya, n'ihi na o siwo n'ebe ọ nọ je biri n'ala ọzọ.


Ọ bu ezie na onye nākwa iko ka i bu, Israel, ma ka ikpe ghara ima Juda; unu abia-kwa-la na Gilgal, unu arigo-kwa-la na Bet-even, unu aṅu-kwa-la iyi, si, Jehova nādi ndu.


Fùanu opì-ike nime Gibea, Fùanu opì nime Rema: tienu nkpu agha nime Bet-even: n'azu gi, Benjamin.


Ife-nzà nke mara umu Josef siri na Jọdan pua Jeriko, na miri Jeriko n'ọwuwa-anyanwu, bú ọzara ahu, nēsi na Jeriko rigo n'ugwu rue Bet-el;


Ife-nzà nke ebo umu Benjamin we puta dika ab͕uru nile ha si di; ókè-ala nke ihe-ife-nzà-ha we puta n'etiti umu Juda na umu Josef.


Joshua nwa Nun we si na Shitim zipu ndikom abua na nzuzo, bú ndi-nledo, si, Jenu, le ala ahu, na Jeriko. Ha we je, ba n'ulo otù nwayi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, ha we dina n'ebe ahu.


na miri ahu nke nēsi n'elu rida guzoro, we bilie n'otù obo, n'ebe di anya nke-uku, n'Adam, bú obodo nke di n'akuku Zaretan: ebìpusi-kwa-ra miri nke nērudata rue osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú: ndi Israel we gabiga na ncherita-iru Jeriko.


(Ma Jeriko mechiri ọnu-uzọ-ama-ya, ewe mechibido ya uzọ n'ihi umu Israel: ọ dighi onye nāpu n'èzí, ọ dighi kwa onye nābà nime.)


Joshua we si na Jeriko ziga ndikom ije Ai, nke di nso Bet-even, n'akuku Iru-anyanwu nke Bet-el, o we gwa ha okwu, si, Rigonu, ledo ala ahu. Ndikom ahu we rigo, ledo Ai.


O we di ka anētib͕u Joshua na Israel nile n'iru ha, ha we b͕alaga n'uzọ ọzara.


Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n'akuku Iru-anyanwu Bet-even.


Follow us:

Advertisements


Advertisements