Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 17:2 - Bible Nso

2 Ife-nzà di kwa nke mara umu Manase fọduru dika ab͕uru nile ha si di; ọ diri umu Abieza, di-kwa-ra umu Hilek, di-kwa-ra umu Asriel, di-kwa-ra umu Shekem, di-kwa-ra umu Hifa, di-kwa-ra umu Shemida: ndia bu umu-ndikom Manase nwa Josef dika ab͕uru nile ha si di.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ya mere, oke a dịịrị ndị fọdụrụ nʼebo Manase dịka ezinaụlọ ha si dị. Agbụrụ Abieza, Helek, Asriel, Shekem, Hefa na Shemida. Ndị a bụ ụmụ ndị ikom agbụrụ Manase, nwa Josef, dịka ikwu ha si dị.

See the chapter Copy




Joshua 17:2
6 Cross References  

Nwa-nne-ya nwayi, bú Hamoleket, we mua Ishhod, na Abieza, na Mahla.


Ife-nzà nke mara ebo Manase di kwa: n'ihi na ya onwe-ya bu ọkpara Josef. Ọ diri Makia ọkpara Manase, bú nna Gilead, n'ihi na onye ahu bu onye-agha, o we nwe Gilead na Beshan.


Ma Zelọfehad, nwa Hifa, nwa Gilead, nwa Makia, nwa Manase, enweghi umu-ndikom, ma ọ nwere umu-ndinyom: ndia bu kwa aha umu-ya ndinyom, Mahla, na Noa, na Họgla, na Milka, na Tiaza.


Mọ-ozi nke Jehova we bia, nọdu n'okpuru osisi terebinth ahu nke di n'Ọfra, nke Joash, bú onye Abieza, nwere: ma Gideon nwa-ya nēticha ọka wheat n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine, iwepu ya n'iru Midian.


Ọ we si ha, Gini ka m'meworo ub͕u a dika nke unu mere? Ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke Efraim, ọ̀ dighi nma kara ọghughọ-nkpuru-vine nke Abieza?


Follow us:

Advertisements


Advertisements