Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 17:16 - Bible Nso

16 Umu Josef we si, Ugwu a ezughi ayi: ma ub͕ọ-ala ígwè di n'aka ndi Kenean nile ndi bi n'ala ndagwurugwu, ma ndi bi na Bet-shean na umu-obodo-ya, ma ndi bi na Jezreel.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ụmụ Josef zara Joshua sị, “Ala ugwu ugwu a agaghị ezuru anyị. Ọzọ, ndị Kenan niile bi nʼala dị larịị nwere ụgbọala igwe, ma ndị niile bi na Bet-Shan, na ụmụ obodo nta ha na ndị bikwa na Ndagwurugwu Jezril.”

See the chapter Copy




Joshua 17:16
20 Cross References  

O rue, na nwa mb͕e ntà, na elu-igwe jiri nji n'igwe-oji na ifufe, oké miri-ozuzo di uku we di. Ehab we nọkwasi n'ub͕ọ-ala, la na Jezreel.


Aka Jehova we di n'aru Elaija; o we ke ihe-ọkiké n'úkwù-ya, b͕a ọsọ n'iru Ehab, rue ebe i nābà Jezreel.


O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Nebot, bú onye Jezreel, nwere ubi-vine, nke di na Jezreel, n'akuku ulo uku Ehab, bú eze Sameria.


Ọzọ kwa, Jehova kwuru okwu bayere Jezebel, si, Nkita gēri Jezebel n'ékpè Jezreel.


Beana nwa Ahailud, nime Teanak na Megido, na Bet-shean nile nke di n'akuku Zaretan, n'okpuru Jezreel, site na Bet-shean rue Ebel-mehola, rue ofè Jọkmeam:


Nkita gēri kwa Jezebel n'òkè-ala-ubi Jezreel, ọ dighi kwa onye nēlì ya. O we meghe uzọ b͕alaga.


ozu Jezebel gādi kwa ka ǹsí-anu n'elu ubi n'òkè-ala-ubi Jezreel; ha ewe ghara isi, Nka bu Jezebel.


N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka anuru udà-opì agha rue Raba nke umu Amon; ọ gāghọ kwa obo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa umu-ya ndinyom ka agēji ọku sure: Israel ewe nweta ndi nwetara ya-ri; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


na Jesreel; na Jokdeam, na Zanoa;


Manase nwekwara obodo n'Isaka na n'Asha, bú Bet-shean na umu-obodo-ya, na Ibleam na umu-obodo-ya, na ndi bi na Doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na En-doa na umu-obodo-ya, na ndi bi na Teanak na umu-obodo-ya, na ndi bi na Megido na umu-obodo-ya, bú ebe di elu atọ ahu.


Joshua we si ha, Ọ buru ndi bara uba ka i bu, rigorue oké ọhia n'onwe-gi, b͕utu-kwa-ra onwe-gi n'ebe ahu n'ala ndi-Perizait na Refaim; ebe ugwu Efraim diri gi nkpa.


Joshua we gwa ulo Josef, bú Efraim na Manase, okwu, si, Ndi bara uba ka i bu, ọ bu kwa ike uku ka i nwere: i gaghi-enwe nání otù ihe-ife-nzà:


n'ihi na ugwu ahu ka i gēnwe; n'ihi na oké ọhia ka ọ bu, i gēb͕utu kwa ya, i gēnwe kwa ọpupu-ya nile: n'ihi na i gānapu ndi Kenean ala-ha, ọ bu ezie na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè, ọ bu kwa ezie na ndi di ike ka ha bu.


Ókè-ala-ha we rue Jezreel, na Kesulot, na Shunem;


Jehova nọye-kwa-ra Juda; o we nweta ugwu; ma ọ pughi inapu ndi bi na ndagwurugwu ala-ha, n'ihi na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè.


Sisera we kpọkọta ub͕ọ-ala-ya nile, bú nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise, na ndi nile ndi soro ya, site na Haroshet nke mba di iche iche ọzọ, rue miri-iyi Kaishon.


Umu Israel we tikue Jehova: n'ihi na o nwere nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise; ya onwe-ya we meb͕usie umu Israel ike orú arọ.


Ndi Midian nile na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu we chikọta onwe-ha, gabiga, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Jezreel.


Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha nile rue Efek: Israel nāma kwa ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi nke di na Jezreel.


Follow us:

Advertisements


Advertisements