Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 15:2 - Bible Nso

2 Ókè-ala Ndida nke ha nwere we di site na nsọtu Oké Osimiri Nnú, site n'ọnu-miri nke nēche iru na Ndida:

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nʼakụkụ ndịda, oke ala ha malitere nʼọnụ ọnụ ndịda osimiri Nnu.

See the chapter Copy




Joshua 15:2
8 Cross References  

Ndia nile jikọtara onwe-ha n'otù na ndagwurugwu Sidim (nke ahu bu Oké Osimiri Nnú).


Jehova gēwezuga ire oké osimiri nke Ijipt ka ebibie ya; Ọ gēji kwa okpom-ọku nke ifufe-Ya feghari aka-Ya n'elu Osimiri, tiputa ya iyi asa, me ka madu zọ ya ukwu n'akpukpọ-ukwu.


Ma akuku Iru-anyanwu, site n'etiti Hauran na Damaskọs na Gilead, na ala Israel, gābu Jọdan; site n'ókè-ala Ugwu rue oké osimiri nke Iru-anyanwu ka unu gātù. Nka bu kwa akuku Iru-anyanwu.


O we sim, Miri ndia nāpu ga na buruburu-ala Iru-anyanwu, ha we rùda n'Araba, rùrue oké osimiri ahu; nime oké osimiri ahu ka miri ahu nke anēme ka ha puta gērùbà; ewe gwọ miri-ya.


akuku Ndida unu nwe-kwa-ra gēsite n'ọzara Zin n'akuku Edom, ókè-ala Ndida unu nwere gēsite kwa na nsọtu ahu nke Oké Osimiri Nnu nke chere iru n'Iru-anyanwu:


Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida.


o we pua rue akuku Ndida nke nrigo Akrabim, gabiga rue Zin, rigo n'akuku Ndida nke Kedesh-banea, gabiga Hezron, rigorue Ada, b͕a buruburu rue Kaka:


na miri ahu nke nēsi n'elu rida guzoro, we bilie n'otù obo, n'ebe di anya nke-uku, n'Adam, bú obodo nke di n'akuku Zaretan: ebìpusi-kwa-ra miri nke nērudata rue osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú: ndi Israel we gabiga na ncherita-iru Jeriko.


Follow us:

Advertisements


Advertisements