Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 15:1 - Bible Nso

1 Ife-nzà nke mara ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di we dirue ókè-ala Edom, rue ọzara Zin n'akuku Ndida, na nsọtu Ndida.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ala ndị a ka e nyere ndị Juda dịka ikwu dị nʼebo ahụ si dị. Ikwu ọbụla ketara ala nke ha site nʼife nza. Ala Juda gbatịrị nnọọ ruo nʼoke ala Edọm, gbatịakwa ruo nʼọzara Zin, kwụsị nʼọnụ ọnụ ndịda ọzara a.

See the chapter Copy




Joshua 15:1
13 Cross References  

umu-ndikom Lia; Reuben, bú ọkpara Jekob, na Simeon, na Livai, na Juda, na Isaka, na Zebulun:


Solomon we me ememe na mb͕e ahu, ya na Israel nile, nkpọkọta uku, site na nbata Hemat rue miri-iyi Ijipt, n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ubọchi asa na ubọchi asa, bú ubọchi iri na anọ.


Ma akuku Ndida nke nēche iru na Ndida gēsite na Tema rue miri Meribot-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku. Nka bu kwa akuku Ndida nēche iru na Negeb.


N'akuku ókè-ala Reuben, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku ọdida-anyanwu; Juda, otù òkè.


ayi we tikue Jehova, O we nu olu-ayi, zite mọ-ozi, me ka ayi si n'Ijipt puta: ma, le ayi onwe-ayi nọ na Kedesh, bú obodo nke di na nsọtu ókè-ala-gi:


si kwa na Jerusalem, si kwa n'Aidumia, na ofè Jọdan, na buruburu Taia na Saidon, biakute Ya, mb͕e ha nuru ihe nile Ọ nēme, ka ha ra.


n'ihi na unu mekpuru ihe-nmekpu megidem n'etiti umu Israel na miri Meriba Kedesh, n'ọzara Zin; n'ihi na unu edoghm nsọ n'etiti umu Israel.


n'ifè-nzà ka ihe-nketa-ha di, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses, bayere ebo iteghete ahu, baye-kwa-ra nkera ebo ahu.


Ókè-ala Ndida nke ha nwere we di site na nsọtu Oké Osimiri Nnú, site n'ọnu-miri nke nēche iru na Ndida:


Ha gēkè kwa ya òkè asa: Juda gēguzo n'ókè-ala-ya na Ndida, ulo Josef gēguzo kwa n'ókè-ala-ha n'Ugwu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements