Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 14:4 - Bible Nso

4 N'ihi na umu Josef bu ebo abua, bú Manase na Efraim: ha enyeghi kwa ndi Livai òkè n'ala ahu, ma-ọbughi obodo ufọdu ibi obi, ha na ebe-ita-nri-ha nke diri anu-ulo-ha na àkù ha kpatara.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nʼihi na ụmụ Josef dị ebo abụọ, ya bụ Manase na Ifrem. Enyeghị ndị Livayị oke nʼala ahụ, karịa obodo ụfọdụ ebe ha ga-ebi na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.

See the chapter Copy




Joshua 14:4
13 Cross References  

Josef we kpọ aha ọkpara-ya Manase: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'chezọ ndọb͕u nile m'dọb͕uru onwem n'ọlu na ulo nile nke nnam.


Aha nke-abua ka ọ kpọrọ Efraim: si, N'ihi na Chineke emewom ka m'mua ọmùmù n'ala ewedaram ala.


Ewe muara Josef n'ala Ijipt Manase na Efraim, ndi Asenat, bú nwa-nwayi Poti-fera onye-nchu-àjà nke On, muru nye ya.


O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na otù onye siri Josef, Le, nna-gi nāria ọria: o we chiri umu-ya ndikom abua ka ha so ya je, bú Manase na Efraim.


Ma ub͕u a umu-gi ndikom abua, ndi amuru nye gi n'ala Ijipt tutu mu abiakute gi n'Ijipt, nkem ka ha bu; Efraim na Manase, dika Reuben na Simeon, gābu ndi m'nwere.


Ma umu-gi, ndi i musoworo ha, ọ bu gi nwe ha; n'aha umu-nne-ha ka agākpọ ha n'ihe-nketa-ha.


Hezekaia we zigara Israel na Juda nile ozi, ọzọ kwa, o degara Efraim na Manase akwukwọ-ozi, ka ha biarue ulo Jehova nime Jerusalem, imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga.


Umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di: Manase na Efraim.


Umu Josef, bú Manase na Efraim, we keta nke ha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements