Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 12:7 - Bible Nso

7 Ndia bu kwa eze ala ahu ndi Joshua na umu Israel tib͕uru n'ofè Jọdan n'akuku Ọdida-anyanwu, site na Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon we rue ugwu Halak, nke nārigo rue Sia; Joshua we nye ya ebo Israel nile ka ọ buru ihe-nnweta dika esi kè ha n'òkè n'òkè;

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị.

See the chapter Copy




Joshua 12:7
16 Cross References  

na ndi Hoa n'ugwu-ha, bú Sia, rue El-peran, nke di n'akuku ọzara.


Jekob we zie ndi-ozi n'iru ya jekuru Isọ nwa-nne-ya rue ala Sia, bú ọhia Edom.


Ndia bu umu-ndikom Sia onye Hoa, ndi bi n'ala ahu; Lotan, na Shobal, na Zibeon, na Ana,


Dishon onye-isi, Iza onye-isi, Dishan onye-isi: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, dika ndi-isi-ha si di n'ala Sia.


Isọ we biri n'ugwu Sia: Isọ bu Edom.


Bú Saihon eze ndi-Amorait, Na Og eze Beshan, Na ala-eze nile nke Kenean:


Ayi we che iru, bulie ije ba n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie, dika Jehova gwaram okwu: ayi we je ugwu Sia buruburu ọtutu ubọchi.


Gi nye kwa ndim iwu, si, Unu onwe-unu nāgabiga n'ókè-ala umu-nne-unu, bú umu Isọ, ndi bi na Sia; ha gātu kwa egwu unu: ma unu gēlezi onwe-unu anya nke-uku:


site n'ugwu Halak, nke nārigo rue Sia, we rue Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon n'okpuru ugwu Heamon: eze-ha nile ka o were, tib͕ue ha, me ka ha nwua.


Joshua we were ala ahu nile, dika okwu nile si di nke Jehova gwara Moses; Joshua we nye ya Israel ka ọ buru ihe-nketa, dika esi kè ha n'òkè n'òkè dika ebo nile ha si di. Ala ahu we rapu ibu-agha, di jū.


Ndi-nchu-aja ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we guzo n'ala-akọrọ n'etiti Jọdan, Israel nile we nagabiga n'ala-akọrọ, rue mb͕e mba ahu nile gabigasiri Jọdan.


O rue, mb͕e eze nile ndi bi n'ofè Jọdan, n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na n'ọnu-miri nile nke oké osimiri uku ahu na ncherita-iru Lebanon, ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, nuru ya;


Follow us:

Advertisements


Advertisements