Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 12:6 - Bible Nso

6 Moses, bú orù Jehova, na umu Israel tib͕uru ha: Moses, bú orù Jehova, we nye ya ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, ka ọ buru ihe-nnweta.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha.

See the chapter Copy




Joshua 12:6
11 Cross References  

Gebea nwa Uri, n'ala Gilead, bú ala Saihon eze ndi-Amorait na nke Og, bú eze Beshan; ma nání ya bu onye edoro onye-isi nke di n'ala ahu.


Moses we si ha, Ọ buru na umu Gad na umu Reuben eso unu gabiga Jọdan, onye ọ bula nke ejikere ibu agha, n'iru Jehova, ewe buda ala ahu n'iru unu; unu gēnye kwa ha ala Gilead ahu, ibu ihe-onwunwe:


Ayi onwe-ayi gāgabiga na njikere n'iru Jehova ba n'ala Kenean, ọ bu kwa n'aka-ayi ka ihe-onwunwe nke ihe-nketa-ayi gādi n'ofè Jọdan.


Moses we nye ha, bú umu Gad, na umu Reuben, na nkera ebo Manase nwa Josef, ala-eze Saihon, bú eze ndi-Amorait, na ala-eze Og, bú eze Beshan, ala ahu, dika obodo-ya nile si di n'ókè-ala nile ha, bú obodo nile nke ala ahu buruburu.


N'ihi na Moses nyere ihe-nketa nke ebo abua na nkera ebo ahu n'ofè Jọdan: ma o nyeghi ndi Livai ihe-nketa n'etiti ha.


N'ihi na ndi Livai enweghi òkè n'etiti unu; n'ihi na ọlu-nchu-àjà Jehova bu ihe-nketa-ha: Gad na Reuben na nkera ebo Manase anarawo kwa ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, nke Moses, bú orù Jehova nyere ha.


Ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka umu-nne-unu zuru ike, dika Ọ gwara ha okwu: ub͕u a kwa chigharianu, jerue ulo-ikwū-unu n'onwe-unu, rue ala ihe-onwunwe-unu, nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'ofè Jọdan.


Follow us:

Advertisements


Advertisements