Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 11:6 - Bible Nso

6 Jehova we si Joshua, Atula egwu n'ihi ha: n'ihi na echi dika na mb͕e a Mu onwem gāra ha nile nye ka ha buru ndi eb͕uru eb͕u n'iru Israel: nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha ka i gēbipu, ọ bu kwa ub͕ọ-ala nile ha ka i gēsure n'ọku.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla ha egwu, nʼihi na echi, nʼoge dịka ugbu a, aga m ewere ha niile nʼọnọdụ ndị egburu egbu nyefee ha nʼaka Izrel. Ị ga-ebipụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, kpọọkwa ụgbọ agha ha niile ọkụ.”

See the chapter Copy




Joshua 11:6
24 Cross References  

Devid we napu n'aka-ya nnù ndi-inyinya anọ na ọgu ise, na orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje: Devid bipu-kwa-ra nkwonkwo-ukwu inyinya ub͕ọ-ala nile, ma o kwere ka ọgu inyinya ub͕ọ-ala ise fọdu n'etiti ha.


Ọ si, Atula egwu: n'ihi na ndi ayi na ha nọ di ọtutu kari ndi ha na ha nọ.


Echi ridanu imegide ha: le, ha nārigo n'uzọ-nrigo Ziz; unu gāchọta kwa ha na nsọtu ndagwurugwu, n'iru ọzara Jeruel.


Ranu aka, mara kwa na Mu onwem bu Chineke: Agēbulim n'etiti mba nile, agēbulim n'uwa.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah


Nēme ka agha nile kwusi rue nsọtu uwa; Ọ nāb͕aji uta, b͕upia kwa ube; Ọ nēsure ub͕ọ-ala nile n'oku.


Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya, Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.


Kama unu siri, É-è, n'ihi na inyinya ka ayi gānọkwasi b͕alaga; n'ihi nka unu gāb͕alaga: unu si-kwa-ra, Anu di ngwa ka ayi gānọkwasi; n'ihi nka ka ndi nāchu unu gādi ngwa.


Ahuhu gādiri ndi ahu ndi nārida n'Ijipt ka ewe yere ha aka, ndi nādabere kwa inyinya, tukwasi obi n'ub͕ọ-ala, n'ihi na ha di ọtutu, tukwasi kwa obi na ndi-inyinya, n'ihi na ha nwere ume nke-uku; ma ha eleghi Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghi kwa Jehova!


Ndi bi n'obodo nile nke Israel gāpu kwa, chiri ihe-agha funwue ọku sure ha, ma ọta ma ọta uku, ma uta ma àkú, ma nkpa-n'aka, ma ube, ha gāchiri ha funwue ọku arọ asa:


Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n'elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n'ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere.


Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēsure kwa ub͕ọ-ala-ya n'anwuru-ọku, ọ bu kwa umu-ọdum-i ka mma-agha gēripia: M'gēbipu kwa anu-ndọb͕u-gi n'uwa, agaghi-anu kwa olu ndi-ozi-gi ọzọ.


I gēripia kwa ndi ahu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi; anya-gi agaghi-emere ha ebere: efè-kwa-la chi-ha di iche iche òfùfè; n'ihi na ọnyà ka ọ gāburu gi.


Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi.


Eze ndia nile we zukọ; ha we bia, makọ ulo-ikwū-ha na miri Mirom, ibuso Israel agha.


Joshua we bia, ya na ndi-agha nile, imegide ha n'akuku miri Mirom na mberede, we dakwasi ha.


Joshua we me ha dika Jehova siri ya: o bipuru nkwonkwo-ukwu inyinya nile ha, sure kwa ub͕ọ-ala nile ha n'ọku.


Joshua we si ndi Israel, Donu onwe-unu nsọ: n'ihi na echi ka Jehova gēme ihe-ebube di iche iche n'etiti unu.


Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, nēguzo kwa n'iru ya na mb͕e ahu,) si, M'gapu kwa ọzọ ibuso umu Benjamin, bú nwa-nnem, agha, ma-ọbu #m'gāgha? Jehova we si, Rigonu; n'ihi na echi ka M'gēnye ya n'aka-gi.


O rue, n'abali ahu, na Jehova siri ya, Bilie, rida imegide ọmuma-ulo-ikwū ahu; n'ihi na enyewom ya n'aka-gi.


Ha we si ndi-ozi biara, Otú a ka unu gāsi ndikom Jebesh-gilead, Echi ka nzọputa gādiri unu, mb͕e anyanwu nēkpo ọku. Ndi-ozi ahu we bia gosi ndikom Jebesh; ha we ṅuria ọṅu.


Follow us:

Advertisements


Advertisements