Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 11:3 - Bible Nso

3 o zigara ndi Kenean n'Ọwuwa-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus n'ugwu, na ndi-Haivait n'okpuru Heamon n'ala Mizpa.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 zigakwara eze ndị Kenan ndị bi nʼọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, zigakwara eze ndị Amọrait, na eze ndị Het, na eze ndị Periz, na nke ndị Jebus nke dị nʼala ugwu. O zigakwara eze ndị Hiv ndị bi na ndịda Hemon, na mpaghara Mizpa.

See the chapter Copy




Joshua 11:3
30 Cross References  

na Mizpa, n'ihi na ọ siri, Ka Jehova che nche n'etiti mu na gi, mb͕e agēzopu ayi, otù onye n'ebe ibe-ya nọ.


Mọ-ozi we setipu aka-ya n'ebe Jerusalem di ibibi ya, Jehova we chègharia n'ihe ọjọ ahu we si mọ-ozi ahu nke nēbibi n'etiti ndi Israel, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nọ n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.


biarue ebe ewusiri ike nke Taia, na obodo nile nke ndi-Haivait na ndi Kenean, purue Negeb Juda, nime Bia-sheba.


Ma eze, bú Esa, mere ka Juda nile nu; ọ dighi onye puru ya: ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; eze, bú Esa, we were ha wue Geba Benjamin na Mizpa.


Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'umu Israel;


Dika igirigi Heamon, Nke nādakwasi n'ugwu nile nke Zaion: N'ihi na n'ebe ahu ka Jehova nyere ngọzi ahu iwu, Bú ndu rue mb͕e ebighi-ebi.


Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha: Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi.


Si na Lebanon som, nwunye ọhu nkem, Si na Lebanon som: Site n'elu Amana le anya, Site n'elu Senia na Heamon, Site n'ebe-obibi nile nke ọdum. Site n'ugwu nile nke agu.


Ma mu onwem, le, m'ganēbi na Mizpa, iguzo n'iru ndi Kaldea, ndi gābiakute ayi: ma unu onwe-unu, chikọtanu manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru na manu, tiye ha n'ihe-unu, biri-kwa-nu n'obodo nile unu nke unu wereworo.


Jeremaia we biakute Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa, ya na ya we biri n'etiti ndi Israel ndi fọduru n'ala-ha.


Ndi Israel nile ndi Ishmael siri na Mizpa dọta n'agha we chigharia, lata, jekuru Johanan nwa Karea.


Ọ bu kwa ndi-Ju nile ndi ha na ya, bú Gedalaia, nọ, nime Mizpa, na ndi Kaldea ndi ahuru n'ebe ahu, bú ndi-agha, ka Ishmael tib͕uru.


Amalek bi n'ala Negeb; ndi Het na ndi Jebus na ndi-Amorait bi n'ugwu: ndi Kenean bi n'usọ oké osimiri, na n'akuku Jọdan.


site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, we rue ugwu Saion (nke ahu bu Heamon),


Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya, mb͕e Ọ gēwepu kwa ọtutu mba n'iru gi, bu ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, mba asa bara uba di kwa ike kari gi;


site n'ugwu Halak, nke nārigo rue Sia, we rue Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon n'okpuru ugwu Heamon: eze-ha nile ka o were, tib͕ue ha, me ka ha nwua.


Jehova we nye ha n'aka Israel, ha we tib͕ue ha, chu kwa ha rue Zaidon bara uba, ru kwa Misrefot-maim, ru kwa ndagwurugwu Mizpe n'akuku Ọwuwa-anyanwu; ha tib͕ue ha, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ha rapuru ha.


na Gilead, na ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat, na ugwu Heamon nile, na Beshan nile rue Saleka;


na ala ndi Gebal, na Lebanon nile, n'ọwuwa-anyanwu, site na Beal-gad n'okpuru ugwu Heamon rue nbata Hemat:


na Dilan, na Mizpe, na Jọkteel;


Ma ndi Jebus, ndi bi na Jerusalem, umu Juda apughi inapu ha ala-ha: ndi Jebus we biri n'etiti umu Juda nime Jerusalem, rue ta.


na Mizpeh, na Kefira, na Moza;


Joshua we si, Nka ka unu gēji mata na Chineke Nke di ndu nọ n'etiti unu, Ọ ghaghi kwa inapu ha ala-ha n'iru unu, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Haivait, na ndi-Perizait, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Jebus.


Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa.


Umu Israel we si, Ònye nọ n'etiti ebo nile nke Israel nke nārigokuteghi Jehova nime nkpọkọta? N'ihi na ọṅuǹu-iyi uku di bayere onye ahu nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa, si, Aghaghi ime ka ọ nwua.


Ha we si, Ònye bu onye ahu n'etiti ebo Israel nile nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa? Ma, le, ọ dighi nwoke si na Jebesh-gilead bata n'ọmuma-ulo-ikwū rue nkpọkọta ahu.


bú ndi-isi ise nke ndi Filistia, na ndi Kenean nile, na ndi Zaidon, na ndi-Haivait ndi bi n'ugwu Lebanon, site n'ugwu Beal-heamon rue nbata Hemat.


Umu Israel we biri n'etiti ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:


Samuel we kpọkọta ndi Israel ibiakute Jehova rue Mizpa;


Follow us:

Advertisements


Advertisements