Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 11:12 - Bible Nso

12 Obodo nile nke ndi-eze ahu, na eze-ha nile, ka Joshua were, o were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga ha ka ebibie ha; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile, jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu.

See the chapter Copy




Joshua 11:12
18 Cross References  

mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāra kwa ha nye n'iru gi, i we tib͕ue ha; i gēwezugasi kwa ha ka ebibie ha; gi na ha ab͕ala ndu, eme-kwa-la ha amara:


Ma i mawo ta, na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye nāgabiga n'iru gi dika ọku nēripia eripia; Ya onwe-ya gēkpochapu ha, Ya onwe-ya gēme kwa ka ha ruru ala n'iru gi: i we napu ha ala-ha, me kwa ka ha la n'iyì ngwa ngwa, dika Jehova gwaworo gi okwu.


O rue, mb͕e Joshua na umu Israel tib͕usiri ha oké ntib͕u nke-uku, rue mb͕e emere ka ha gwusia, mb͕e ndi fọduru, bú ndi fọduru n'etiti ha, basi-kwa-ra n'obodo ewusiri ike,


Joshua we were Makeda n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya na eze-ya; o wezugara ha na madu nile nke di nime ya ka ebibie ha, ọ dighi onye fọduru ọ rapuru: o me eze Makeda dika o mere eze Jeriko.


Jehova we nye kwa ya na eze-ya n'aka Israel; o were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru nime ya; o me eze-ya dika ọ mere eze Jeriko.


Jehova we nye Lekish n'aka Israel, o were ya n'ubọchi nke-abua, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na madu nile nke di nime ya, dika ihe nile si di nke o mere Libna.


ha were ya n'ubọchi ahu, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, madu nile nke di nime ya ka ọ wezugara ka ebibie ha n'ubọchi ahu, dika ihe nile si di nke o mere Lekish.


ha were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, na eze-ya, na obodo-ya nile, na madu nile nke di nime ya; ọ dighi onye fọduru ọ rapuru, dika ihe nile si di nke o mere Eglon; o wezuga ya ka ebibie ya, na madu nile nke di nime ya.


Nání, obodo nile nke Jehova nke nēguzo n'obo-ha, Israel esureghi ha ọku, nāgughi Hezoa nání ya; nke ahu ka Joshua surere ọku.


Dika Jehova nyere Moses, bú orù-Ya, iwu, otú a ka Moses nyere Joshua iwu: otú a ka Joshua me-kwa-ra; o wezugaghi okwu ọ bula n'ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu.


ndi nile bi n'ugwu site na Lebanon rue Mizrefot-maim, bú ndi Zaidon nile; Mu onwem nānapu ha ala-ha n'iru umu Israel: nání me ka ọ dayere Israel n'ihe-nketa, dika M'nyeworo gi iwu.


Jehova we me ka ha zuru ike buruburu, dika ihe nile si di nke Ọ ṅuru ndi bu nna-ha iyi: ọ dighi kwa nwoke ọ bula n'etiti ndi-iro-ha nile guzoro n'iru ha; ndi-iro-ha nile ka Jehova nyere n'aka-ha.


dika Moses, bú orù Jehova, nyere umu Israel iwu, dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, bú ebe-ichu-àjà nkume zuru okè, nke ọ nēmeghi ka ígwè ga n'elu ha: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, chu kwa àjà-udo.


Ọ gēru kwa, mb͕e unu wereworo obodo ahu, na unu gēsu obodo ahu ọku; dika okwu Jehova si di, otú a ka unu gēme: lenu, enyewom unu iwu.


Ha we za Joshua, si, N'ihi na egosiri ndi-orù-gi n'ezie na Jehova, bú Chineke-gi, nyere Moses, bú orù-Ya, iwu inye unu ala nka nile, na ikpochapu ndi nile bi n'ala nka n'iru unu; ayi we tua egwu nke-uku bayere ndu-ayi n'ihi unu, ayi we me ihe a.


Follow us:

Advertisements


Advertisements