Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 10:11 - Bible Nso

11 O rue, mb͕e ha si n'iru Israel b͕alaga, mb͕e ha nọ na nrida Bet-horon, na Jehova si n'elu-igwe tudakwasi ha nkume uku rue Azeka, ha we nwua: ndi nwuru na nkume ákú-miri-ígwé ahu kariri ndi umu Israel were mma-agha b͕ue.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Mgbe ha si nʼihu Izrel gbapụ ọsọ nʼụzọ nrịda Bet-Horon na-aga Azeka, Onyenwe anyị sitere nʼelu na-atụdakwasị ha ọtụtụ mkpụrụ mmiri. Ọnụọgụgụ ndị mkpụrụ mmiri ndị a dagburu dị ukwuu karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha ha gbuo.

See the chapter Copy




Joshua 10:11
17 Cross References  

Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ;


Ewe nāb͕asa agha ahu n'ebe ahu n'elu ala ahu nile; oké ọhia ahu we ripia ọtutu madu n'etiti ndi Israel n'ubọchi ahu kari ndi mma-agha ripiara.


Ì bàwo n'ulo-nkwakọba nile nke snow, Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe,


Nke M'b͕ochiworo nye mb͕e nkpà, Nye ubọchi ọ̀gù na agha?


Ya me ka ib͕udu zokwasi ndi nēmebi iwu dika miri-ozuzo; Ka ọku na brimstone na ifufe di ọku buru òkè ìko-ha.


Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha: Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya?


Le, otù onye di ike nke nwere ume ka Onye-nwe-ayi nwere; dika oké miri-ozuzo nke ákú-miri-ígwé, dika oké ifufe nke nēfechapu efechapu, dika oké miri-ozuzo nke miri di ike nērubiga ókè, otú a ka o jiworo ihe-ike tọb͕o ihe n'ala.


N'ihi na dika n'ugwu Perazim, otú a ka Jehova gēbili; dika na ndagwurugwu Gibeon, otú a ka Ọ gēwe oké iwe; ilu ọlu-Ya - nke onye ala ọzọ ka ọlu-Ya bu; na ifè òfùfè-Ya - nke onye ala ọzọ ka òfùfè-Ya bu.


Jehova gēme kwa ka anu ebube nke olu-Ya, Ọ gēme kwa ka ahu ndakwasi nke ogwe-aka-Ya, n'ọnuma nke iwe-Ya, na ire-ọku nke ọku nērichapu erichapu, na ntupia, na oké miri-ozuzo, na ákú-miri-ígwé.


gi si ndi nēte ya nzu, na ọ gāda: oké miri-ozuzo nke nēzobiga ókè gēzo; unu onwe-unu kwa, oké ákú-miri-ígwé, gāda; oké ifufe gāb͕awa kwa ya.


n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, bu onye nēso unu je, iburu unu agha megide ndi-iro-unu, ka O we zọputa unu.


Ewe meghe ulo nsọ nke Chineke nke di n'elu-igwe; ewe hu ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu-Ya n'ulo nsọ Ya; àmùmà, na olu, na éb͕è-elu-igwe, na ala-ọma-jijiji, na oké ákú-miri-ígwé we so.


Oké ákú-miri-ígwé, nke ra ka talent n'arọ́ n'otù, nēsi kwa n'elu-igwe ridata n'aru madu: madu we kwulu Chineke site n'ihe-otiti nke ákú-miri-ígwé ahu; n'ihi na ihe-otiti-ya di uku ri nne.


N'elu-igwe ka ha si bū agha, Kpakpando si n'uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements