Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 1:2 - Bible Nso

2 Moses, bú orùm anwuruwo; ma ub͕u a bilie, gabiga Jọdan nka, gi onwe-gi, na ndi nke a nile, rue ala ahu nke Mu onwem nēnye ha, bú umu Israel.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Mosis, odibo m anwụọla. Ugbu a, jikere onwe gị, meekwa ka ndị m jikere ịgafe ofe ọzọ nke osimiri Jọdan, ịbanye nʼala ahụ m na-aga inye ha, bụ ndị Izrel.

See the chapter Copy




Joshua 1:2
13 Cross References  

M'gēnye kwa gi, nye kwa nkpuru-gi gānọchi gi, ala ọnọdu-ọbìa-gi nile, bú ala Kenean nile, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi; M'gābu-kwa-ra ha Chineke.


I me-kwa-ra ka umu-ha ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, I we me ka ha ba n'ala ahu nke I siri ndi bu nna-ha ka ha ba inweta ya.


Jehova we si Setan Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.


Le orùm, onye M'nējide aka; onye nkem M'rọputara, onye ihe-ya tọrọ nkpuru-obim utọ: atukwasiwom ya Mọm; ikpé ka ọ gēweputara mba nile.o


Ọ bughi otú a ka orùm Moses di; n'ulom nile onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu


Nye kwa Joshua iwu, me kwa ya ka ọ di ike, b͕a kwa ya ume: n'ihi na ya onwe-ya gāgabiga n'iru ndi nka, ya onwe-ya gēme kwa ka ha keta ala ahu nke i nāhu.


Moses we kpọ Joshua òkù, si ya n'anya Israel nile, Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēsoro ndi nka ba n'ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi ínye ha; gi onwe-gi gēme kwa ka ha keta ya.


Moses, bú orù Jehova, we nwua n'ebe ahu n'ala Moab, n'okwu-ọnu Jehova.


O rue, mb͕e ọnwu Moses, bú orù Jehova, gasiri, na Jehova gwara Joshua nwa Nun, bú onye nējere Moses ozi, okwu, si,


Gabiganu n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Doziere onwe-unu ihe unu gēri n'uzọ; n'ihi na ọ fọduru ubọchi atọ unu ewe gabiga Jọdan nka, ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu inweta ya.


Follow us:

Advertisements


Advertisements