Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Joshua 1:11 - Bible Nso

11 Gabiganu n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Doziere onwe-unu ihe unu gēri n'uzọ; n'ihi na ọ fọduru ubọchi atọ unu ewe gabiga Jọdan nka, ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu inweta ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 “Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke na-enye unu.’ ”

See the chapter Copy




Joshua 1:11
9 Cross References  

Jeghachi, si Hezekaia, bú onye-ndú ndim, Otú a ka Jehova, bú Chineke Devid nna-gi, siri, Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M'nēme ka aru-gi di ike: n'ubochi nke-atọ i gārigoru ulo Jehova.


nọ na njikere nye ubọchi nke-atọ: n'ihi na ọ bu n'ubọchi nke-atọ ka Jehova gāridata n'anya ndi Israel nile n'elu ugwu Sainai.


Ọ gēme ka ayi dighachi ndu mb͕e ubọchi abua gasiri: n'ubọchi nke-atọ ka Ọ gēme ka ayi bilie, ayi ewe di ndu n'iru Ya.


N'ihi na unu onwe-unu nāgabiga Jọdan ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu, unu gēnweta kwa ya, biri nime ya.


M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.


Nuru, Israel: gi onwe-gi nāgabiga Jọdan ta, ibà ka i we nweta mba di iche iche di uku di kwa ike kari gi, obodo di iche iche di uku nke ewusi-kwa-ra ike rue elu-igwe;


Joshua we nye ndi-ọchi-agha ndi Israel iwu, si,


Moses, bú orùm anwuruwo; ma ub͕u a bilie, gabiga Jọdan nka, gi onwe-gi, na ndi nke a nile, rue ala ahu nke Mu onwem nēnye ha, bú umu Israel.


O rue, n'ọgwugwu ubọchi atọ, na ndi-ọchi-agha gabigara n'etiti ọmuma-ulo-ikwū;


Follow us:

Advertisements


Advertisements