Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 9:8 - Bible Nso

8 Àkú nke nēb͕u eb͕u ka ire-ha bu; okwu aghughọ ka o kwuworo: n'ọnu-ya ka madu nāgwa onye-ab͕ata-obi-ya okwu udo, ma n'obi-ya ọ nēche ya anwu.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”

See the chapter Copy




Jeremaya 9:8
21 Cross References  

Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.


Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya: Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu.


Ka Jehova bipu eb͕ub͕ere-ọnu nile nke nekwu okwu ire-utọ, Na ire nke nēkwu oké ihe:


Gini ka agēnye gi, ọ̀ bu kwa gini ka agātukwasiri gi, Gi ire aghughọ?


Adọkpurulam tiyere ndi nēmebi iwu, Tiye-kwa-ra ndi nālu ajọ ihe; Ndi nāgwa madu-ibe-ha okwu udo, Ma ihe ọjọ di n'obi-ha.


N'ihi na ọ bughi okwu udo ka ha nēkwu: Ma ha nēchèputa okwu di iche iche nke aghughọ nile imegide ndi nọ jū n'ala.


Ha bu okwu ire-utọ, bú okwu ọnu-ya nke di ka miri-ara raru araru, Ma nání agha ka obi-ya bu: Okwu-ya nile di nrò kari manu, Ma okwu ahu bu mma-agha amiputara amiputa.


Nkpuru-obim nọ n'etiti ọdum; M'gēdina n'etiti ndi nēre ọku, Bú umu madu, ndi ezé nile ha bu ube na àkú, Ire-ha bu kwa mma-agha di nkọ.


Nēdere nání Chinek du, nkpuru-obim; N'ihi na ọ bu Ya ka olile-anyam si puta.


Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha: Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya.


Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọ Ka onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu.


N'ihi na ahuwo ndi nēmebi iwu n'etiti ndim: ha nēle anya buruburu, dika ndi-osi-ọnyà si eche anwu; ha esiwo ọnyà, ọ bu madu ka ha nānwude.


M'gaghi-eleta n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀?


Ha we kwe ire-ha, dika uta-ha, ib͕a okwu-ugha dika àkú; ma ọ bughi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di ka ha diworo ike n'ala: n'ihi na ha esiwo n'ihe ọjọ pukuru ihe ọjọ, ma Mu ka ha nāmaghi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Lezienu anya, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, unu atukwasi-kwa-la nwa-nne ọ bula obi: n'ihi na nwa-nne ọ bula nējidesi ikiri-ukwu nwa-nne-ya ike, ọzọ, onye-ab͕ata-obi ọ bula nējeghari nāb͕a àmà ọjọ.


Ha nākwa kwa emò, onye ọ bula onye-ab͕ata-obi-ya, ma ezi-okwu ka ha nādighi-ekwu: ha ezíwo ire-ha ikwu okwu-ugha; ọ bu n'ime ajọ omume ka ike gwuru ha.


N'ihi na ndi-ọgaranya-ya juputara n'ihe-ike, ndi bi nime ya ekwuwo kwa okwu-ugha, ire-ha di kwa aghughọ n'ọnu-ha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements