Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 9:2 - Bible Nso

2 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na m'nwere ebe inọ ọnọdu-abali nke ndi-ije n'ọzara; ka m'we rapu ndim, si n'ebe ha nọ la! n'ihi na ha nile bu ndi nākwa iko, nzukọ ndi-nghọb͕u.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nwere ụlọ ndị ije e wuru nʼime ọzara. Ka m nwee ike hapụ ndị m site nʼebe ha nọ pụọ. Nʼihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko, igwe ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.

See the chapter Copy




Jeremaya 9:2
24 Cross References  

N'ihi na ejiwo ọbara meru aka-unu, ejiwo kwa ajọ omume meru nkpisi-aka-unu; eb͕ub͕ere-ọnu-unu ekwuwo okwu-ugha, ire-unu nātamu ajọ ihe.


Onye ezi omume ka I bu, Jehova, mb͕e mu na Gi nēkperita ikpe: ma otú ọ di, okwu ikpem nile ka m'gēkwu n'ebe I nọ: gini mere uzọ ndi nēmebi iwu ji agara ha nke-ọma? gini mere ndi nile nāghọb͕u nke-uku ji anọ n'udo?


N'ihi na ọbuná umu-nne-gi, na ulo nna-gi, ọbuná ha onwe-ha aghọb͕uwo gi; ọbuná ha onwe-ha akpọzuwo nkpu n'azu gi: ekwela ha, mb͕e ha gāgwa gi ezi ihe.


Ma mb͕e i gāsi n'obi-gi, Gini mere ihe ndia ji dakwasim? n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi ka eji kpughe ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi, me ikiri-ukwu-gi abua ihe-ike.


N'ihi na ala nka juputara na ndi nākwa iko; n'ihi na site n'ọb͕ub͕a-iyi ala nka nēru újú; ebe-ita-nri nile nke ọzara akpọwo nku; ọb͕ub͕a-ọsọ-ha di kwa njọ, idi-ike-ha abughi kwa ihe ziri ezi.


N'ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n'ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.


Jegharianu n'èzí nile nke Jerusalem, biko, hunu, we mara, chọ-kwa-nu n'amá-ya nile, ma ọ buru na unu gāchọta nwoke ọ bula, ọ buru na ọ di onye nēme ihe ekpere n'ikpé, onye nāchọ ikwesi-ntukwasi-obi; M'gāb͕aghara kwa obodo a.


N'ihi na ulo Israel na ulo Juda aghọb͕uwom nke-uku, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma ọ buru na ha asi, Jehova nādi ndu; n'ezie n'okwu-ugha ka ha na-aṅu iyi.


Ọ bu nání ọb͕ub͕a-iyi, na okwu-ugha, na ob͕ub͕u-madu, na izu-ori, na ikwa-iko; ha etipúwo etipú, iwusi-ọbara-madu emetuwo kwa iwusi-ọbara-madu.


Jehova ka ha ghọb͕uworo; n'ihi na umu nābughi nke Ya ka ha muworo: ub͕u a ka ọnwa ọhu gēripia ha, ha na òkè nile ha.


Ma ndi ahu agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, dika Adam: n'ebe ahu ka ha ghọb͕uworom.


Ha nile bu ndi nākwa iko; ha di ka ite-ọku uku nke osi-ite meworo ka ọ di ọku; ọ kwusiri ikpọnwu site na mb͕e edoziri utu ọka flour agwọrọ agwọ rue mb͕e emere ka o ko eko.


N'ihi na ndi-ọgaranya-ya juputara n'ihe-ike, ndi bi nime ya ekwuwo kwa okwu-ugha, ire-ha di kwa aghughọ n'ọnu-ha.


Ndi-amuma-ya bu ndi obi-ha nādighi n'otù ebe, ndi-nghọb͕u: ndi-nchu-àjà-ya emewo ka ihe nsọ ghara idi nsọ, ha emewo iwu ihe-ike.


Juda aghọḅuwo nghọḅu, ọ bu kwa ihe-árú ka emeworo n'Israel na nime Jerusalem; n'ihi na Juda emewo ka idi-nsọ Jehova nke Ọ huworo n'anya ghara idi nsọ, ọ luwo kwa nwa-nwan yi nke chi ala ọzọ.


Ma unu asiwo, N'ìhi gini? N'ihi na Jehova aburuwo onye-àmà n'etiti gi na nwunye i lutara n'okorọbia, onye gi onwe-gi ghọḅuworo, ọ bu ezie na ya onwe-ya bu nwan yi ejikọtara gi na ya, na nwunye ọḅuḅa-ndu-gi.


Unu ndi nākwa iko, ùnu amataghi na ibu eyì nke uwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bula nke zubere ibu eyì nke uwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke.


Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel.


Follow us:

Advertisements


Advertisements