Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 9:18 - Bible Nso

18 ka ha me kwa ngwa, buliere ayi igo-ákwá, ka anya-miri we si n'anya-ayi rùda, ka miri we si kwa na mbubere-anya-ayi rùputa.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ha bịa ngwangwa kwaa akwa nʼihi anyị, tutu anya mmiri akwa ejupụta ha nʼanya, tutu anya mmiri akwa esite anyị nʼanya na-asọda ruo na ntị anyị.

See the chapter Copy




Jeremaya 9:18
19 Cross References  

Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua, N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.


N'ihi nka ka m'siri, Lepunum anya, m'gākwakpọ anya; unu adọgbula onwe-unu ikasim obi, n'ihi nbibi ada nke ndim.


Ma ọ buru na unu anughi ya, na nzuzo ka nkpuru-obim gākwa ákwá n'ihi npako-unu; anya-miri gāpu kwa n'anyam nke-uku, anya-miri ewe si n'anyam rùda, n'ihi na adọtara ìgwè aturu Jehova n'agha.


I gāgwa kwa ha okwu a, si, Ka anya-miri si n'anyam erùda abali na ehihie, ka ha ghara kwa iguzo du; n'ihi na nb͕aji ukwu na aka di uku ka ejiworo b͕aji ada ndim nāmaghi nwoke, ọ bu ntiputa-ọnyá nke jọrọ njọ nke-uku.


Ma ihe-ihere ahu erichapuwo ihe putara na ndọb͕u nna-ayi-hà dọb͕uru onwe-ha n'ọlu site na mb͕e ayi di na nwata; ìgwè ewu na aturu-ha na ìgwè ehi-ha, na umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom.


Ka ayi dina ala n'ihere-ayi, ka ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya kpuchi kwa ayi: n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi mehieworo megide, ayi onwe-ayi na nna-ayi-hà, site na mb͕e ayi di na nwata we rue ta: ayi egeghi kwa nti n'olu Jehova, bú Chineke-ayi.


Ntipia n'elu ntipia ka anākpọ; n'ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n'otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile.


Ada nke ndim, ke ákwà-nkpe n'úkwù-gi, turua onwe-gi na ntu: mere onwe-gi oruru-újú dika nke nwa-nwoke enwere nání ya, bú iti-aka-n'obi di ilu nke-uku; n'ihi na ọ bu na mberede ka onye nāpunara madu ihe gābiakwasi ayi.


Kọpu isi-gi, Jerusalem, tufue ya, buli kwa abù-ákwá n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi; n'ihi na Jehova ajuwo, rapu kwa ọb͕ọ nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na isim bu miri miri, asi anyam abua bu isi-iyi nke anya-miri, ka m'we kwa ákwá n'ehihie na abali bayere ndi eb͕uru eb͕u nke ada ndim!


Ugwu nile ayi ka m'gēbuliri ikwa-ákwá na igo-ákwá, buli-kwa-ra ebe-ita-nri nile nke ọzara abù-ákwá, n'ihi na esuresiwo ha ọku, ọ we ghara idi onye ọ bula nāgabiga; anughi kwa olu anu-ulo; ma anu-ufe nke elu-igwe ma anumanu ab͕alagawo, ha alawo.


Ma nurunu okwu Jehova, unu ndinyom, ka nti-unu nara kwa okwu ọnu-Ya, zí-kwa-nu umu-unu ndinyom igo-ákwá, ka nwayi ọ bula zí kwa nwayi-ibe-ya abù-ákwá.


Ọ nākwasi ákwá ike n'abali, anya-miri-ya di kwa na ǹtì-ya abua; Ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere n'etiti ndi nile nāhu ya n'anya: Ndi-eyì-ya nile aghọb͕uwo ya, Ha aghọworo ya ndi-iro.


Anyam abua adalawo n'isi site n'anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku, Awusiwo umejum n'ala dika miri, n'ihi ntipia nke ada ndim; N'ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n'amá nile nke obodo.


Gini, bu àmà M'gāb͕ara gi? gini ka M'gēji tuyere gi, gi ada Jerusalem? Gini ka M'gēme ka gi na ya rata, ka M'we kasie gi obi, gi ada Zaion nāmaghi nwoke? N'ihi na ihe di uku dika oké osimiri ka nb͕awa-gi bu: ònye gāgwọta gi?


Obi-ha tikuru Onye-nwe-ayi nkpu: Gi mb͕idi ada Zaion, me ka anya-miri rùda dika osimiri ehihie na abali; Enyela onwe-gi izu-ike; ka nwa-anya-gi ghara ikwusi akwusi.


Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.


N'ihi nka ka Jehova bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye-nwe-ayi, jiri si otú a: N'amá nile ka otiti-aka-n'obi gādi; ọ bu kwa n'èzí nile ka ha gāsi, Éwù! éwù! ha gākpọ kwa onye-ubi ibia iru-újú, kpọsa-kwa-ra ndi mara igu awa otiti-aka-n'obi.


Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá,


Follow us:

Advertisements


Advertisements