Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 9:13 - Bible Nso

13 Jehova we si, N'ihi na ha arapuwo iwum nke M'tiyere n'iru ha, na n'ihi na ha egeghi nti olum, ghara kwa ijeghari nime ya;

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m.

See the chapter Copy




Jeremaya 9:13
11 Cross References  

Ma ọ buru na unu onwe-unu alaghachi azu, we rapu ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, nke M'tiyeworo n'iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha:


Ma ub͕u a, Chineke-ayi, àyi gāsi gini mb͕e ihe a gasiri? n'ihi na ayi arapuwo ihe nile I nyere n'iwu,


Iwe di ọku ejidewom, N'ihi ndi nēmebi iwu ndi nārapu iwu-Gi.


Ndi nārapu iwu nēto onye nēmebi iwu, Ma ndi nēdebe iwu nāluso ha ọ̀gù.


Ndi ọjọ nka ndi nāju inu okwum nile, ndi nējeghari n'isi-ike nke obi-ha, we jeso chi di iche iche ọzọ ifè ha, na ikpọ isi ala nye ha, ndi nka gādi kwa ka ihe-ọkiké a, nke nādighi-abà n'ihe ọ bula.


Ha gāsi kwa, Ọ bu n'ihi na ha rapuru ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-ha, we kpọ isi ala nye chi ọzọ di iche iche, fè ha.


Ọ gēru kwam mb͕e unu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova, bú Chineke-ayi, meworo ayi ihe nile ndia? na i gāsi ha, Dika unu rapurum, we fè chi di iche iche nke ala ọzọ n'ala-unu, otú a ka unu gēfè ndi ala ọzọ n'ala nābughi nke unu.


ma ha egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we kwesie olu-ha ike: ha mere ihe ọjọ kari ndi bu nna-ha.


Follow us:

Advertisements


Advertisements