Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 9:10 - Bible Nso

10 Ugwu nile ayi ka m'gēbuliri ikwa-ákwá na igo-ákwá, buli-kwa-ra ebe-ita-nri nile nke ọzara abù-ákwá, n'ihi na esuresiwo ha ọku, ọ we ghara idi onye ọ bula nāgabiga; anughi kwa olu anu-ulo; ma anu-ufe nke elu-igwe ma anumanu ab͕alagawo, ha alawo.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa. Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara. Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya. A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ. Ụmụ nnụnụ efefusịala. Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala.

See the chapter Copy




Jeremaya 9:10
30 Cross References  

Le, emewom ka i ghọ ihe-nkpọre eji azọcha ọka, bú ihe di nkọ di ọhu nwere ezé: i gāzọcha ugwu, zọpia ha, i gēme kwa ugwu ntà ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka.


N'ihi na, nkpọnkpọ ebe-gi nile na ebe-gi nile tọb͕ọrọ n'efu na ala-gi akwadara akwada, n'ezie ub͕u a i gādikara ndi bi n'ala nkpà, ndi nēloda gi gānọ kwa n'ebe di anya.


Ọtutu ndi-ọzùzù-aturu ebibiwo ubi-vine nkem, ha azọdawo òkèm, ha emewo òkèm anāchọsi ike ka ọ ghọ ọzara tọb͕ọrọ n'efu.


O mewo ya ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; o nēru újú n'ebe m'nọ, ebe ọ tọb͕ọrọ n'efu; ebe tọb͕ọrọ n'efu ka ala nka nile bu, n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nētiye ya n'obi.


Rùe ole mb͕e ka ala gēru újú? rùe ole mb͕e ka ihe-ọkukú nke ubi nile gākpọnwu? site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya ekpochapuwo anu-ulo nile na anu-ufe; n'ihi na ha siri, Ọ gaghi-ahu ikpe-azu-ayi.


Inyinya-ibu-ọhia eguzowo kwa n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi, ha ekubawo ifufe dika nkita-ọhia; anya-ha adalawo n'isi, n'ihi na ihe-ọkukú adighi.


Ya ka umu-ọdum nāb͕o uja, ha ewewo ka olu-ha da udà: ha we me ka ala-ya ghọ ebe tọbọrọ n'efu; esuresiwo obodo-ya nile oku, ha we ghara inwe onye-obibi.


Ha asighi kwa, Òle ebe Jehova nọ, bú Onye meworo ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa; Onye meworo ka ayi je ije n'ọzara, n'ala nke ebe ihe nādighi na nke olùlù, n'ala ọkpọ-nku na nke onyinyo ọnwu, n'ala nke ọ nādighi onye gabigara nime ya, na nke madu nēbighi n'ebe ahu?


N'ihi na ala nka juputara na ndi nākwa iko; n'ihi na site n'ọb͕ub͕a-iyi ala nka nēru újú; ebe-ita-nri nile nke ọzara akpọwo nku; ọb͕ub͕a-ọsọ-ha di kwa njọ, idi-ike-ha abughi kwa ihe ziri ezi.


N'ihi na otù mba esiwo n'Ugwu rigoputa imegide ya, mba ahu gēme ka ala-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ dighi kwa onye ganēbi nime ya: ma madu ma anumanu, ha awaghariwo, la.


Kọpu isi-gi, Jerusalem, tufue ya, buli kwa abù-ákwá n'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi; n'ihi na Jehova ajuwo, rapu kwa ọb͕ọ nke nrubiga-ókè nke iwe-Ya.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na agamab͕asa irum megide unu taa! n'arum ka aru nādighi obim ike.


N'ihi ihe ndia ka mu onwem nākwa ákwá; anyam, anyam nērùda miri; N'ihi na onye-nkasi-obi nke nēweghachi nkpuru-obim di anya n'ebe m'nọ; Umum tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na onye-iro di ike.


Anyam abua adalawo n'isi site n'anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku, Awusiwo umejum n'ala dika miri, n'ihi ntipia nke ada ndim; N'ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n'amá nile nke obodo.


N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu; Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.


Asi na emem ka ajọ anu-ọhia gabiga n'ala ahu, ha we b͕aba ya aka, o we ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye ọ bula nāgabiga ya n'ihi anu-ọhia ahu;


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buliere Taia abù-ákwá;


Ọ dighi ukwu madu gāgabiga nime ya, ọ dighi kwa ukwu anumanu gāgabiga nime ya, agaghi-ebi kwa nime ya ọgu arọ abua.


M'gēme kwa ka ala-unu ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, npako nke ike-ya gākwusi kwa; ugwu nile nke Israel gātọb͕ọ kwa n'efu, ghara inwe onye nāgabiga ha.


N'ebe-obibi nile unu ka agēme ka obodo nile ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe nile di elu gātọb͕ọ kwa n'efu; ka ebe-ichu-àjà nile unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, tọb͕ọrọ kwa n'efu, ka ewe tipia kwa arusi nile unu, ha ewe kwusi, ka ewe b͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, hichapu ọlu nile unu.


N'ihi nka ka ala nka gēru újú, onye ọ bula nke bi nime ya gāta kwa aru, ya na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe; ọ bu kwa azù nile nke oké osimiri ka agēkpochapu.


Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu.


Ọ bu Gi, Jehova, ka m'nākpọku: n'ihi na ọku erichapuwo ebe-ita-nri nile nke ọzara, ire-ọku esuyewo kwa ọku n'osisi nile nke ọhia.


Nurunu okwu a nke Mu onwem nēbuli n'isi unu ka ọ buru abù-ákwá, unu ulo Israel.


N'ihi nka ka Jehova bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye-nwe-ayi, jiri si otú a: N'amá nile ka otiti-aka-n'obi gādi; ọ bu kwa n'èzí nile ka ha gāsi, Éwù! éwù! ha gākpọ kwa onye-ubi ibia iru-újú, kpọsa-kwa-ra ndi mara igu awa otiti-aka-n'obi.


N'ubọchi ahu ka agātu ilu megide unu, gosie ákwá ike, si: Apunarisiwo ayi ihe: òkè ndim ka Ọ nāb͕anwe: le ka O si ewepurum ya nke-uku! ọ bu onye nke nādaghachi azu ka Ọ nēkère ubi nile ayi.


N'ihi nka ka agēji plough gwu Zaion dika ubi n'ihi unu, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.


Follow us:

Advertisements


Advertisements