Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 8:7 - Bible Nso

7 Ọbuná ub͕ala n'elu-igwe mara mb͕e-ya nile akara àkà; ọzọ, nduru na eleke na okwoli nāriba mb͕e ọbibia-ha ama; ma ndim amaghi ikpé Jehova.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe maara oge ya a kara aka. Nduru, na eleke, na okwolo makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ. Ma ndị m amaghị ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.

See the chapter Copy




Jeremaya 8:7
10 Cross References  

Ahuwo okoko-ọhia anya n'ala; Mb͕e abù ọma nke umu-nnunu eruwo, Anuwo kwa olu nduru n'ala-ayi;


Ehi mara onye-nwe-ya, inyinya-ibu ma-kwa-ra ebe-ọzùzù-anu nke onye-nwe-ya: ma Israel amaghi, ndim atukwasighi uche.


Mb͕e ngalaba-ya kpọnwuru akpọnwu, agānyajipu ha; ndinyom abia sure ha ọku: n'ihi na ọ bughi ndi nwere nghọta ka ọ bu; n'ihi nka Onye meworo ya agaghi-enwe obi-ebere n'aru ya, Onye kpuworo ya agaghi-emere ya amara.


Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme.


N'ihi na ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ ka ndim bu, Mu ka ha nāmaghi; umu di nzuzu ka ha bu, ndi nādighi-aghọta ihe ka ha bu: ndi mara ihe ka ha bu n'ime ihe ọjọ, ma ime ezi ihe ka ha nāmaghi.


N'ihi ya ọdum nke sitere n'oké ọhia gētib͕u ha, anu-ọhia wolf nke ala ihe nādighi gēbibi ha, agu ganēche obodo nile ha anya, agādọb͕u onye ọ bula nke nāpu nime ha: n'ihi na njehie-ha di ọtutu, ndaghachi-azu nile nke ha di kwa ike.


N'ihi nka ka iwu nēsinwu, ikpe ziri ezi adighi-aputa kwa rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na onye nēmebi iwu nāb͕a onye ezi omume buruburu; n'ihi nka ka ikpé nāputa buru ihe b͕agọrọ ab͕agọ.


M'we welie anyam abua, hu, ma le, ndinyom abua nāputa, ifufe di kwa na nkù-ha, n'ihi na ha nwere nkù abua dika nkù ub͕ala: ha we bulie ephah ahu n'etiti ala na elu-igwe.


Follow us:

Advertisements


Advertisements