Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 7:34 - Bible Nso

34 M'gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: n'ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Mgbe ahụ, aga m eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye nʼobodo niile nke Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem kwụsị. Ala ahụ ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu.

See the chapter Copy




Jeremaya 7:34
23 Cross References  

Le, ka abali ahu ghọ nwayi-àgà; Ka iti-nkpu-ọṅù ghara ibà nime ya.


Ọku ripiara umu-okorọbia-ha; Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.


Ala-unu bu ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-unu, esurewo ha n'ọku; ala-ubi-unu, n'iru unu ka ndi ala ọzọ nēri ya, ọ bu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, dika nkwatu ndi ala ọzọ.


Ọnu-uzọ-ya nile gēze ume, ru kwa újú; agēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, ọ gānọdu n'ala.


M'we si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi? O we si, Rue mb͕e obodo nile tọb͕ọrọ n'efu nēnweghi onye-obibi, ulo nile kwa, nēnweghi madu; rue mb͕e emeworo ka ala ndi ahu tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ebe tọb͕ọrọ n'efu,


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n'ebe a n'anya-unu na n'ubọchi-unu.


N'ihi na ihe di otú a ka Jehova kwuru bayere ulo eze Juda, si: Gilead ka i burum, bú isi Lebanon: ma aghaghm ime gi ka i ghọ ọzara, na obodo nke madu nēbighi.


Ọzọ, M'gēme ka olu obi-utọ, na olu ọṅù, na nwoke nālu nwunye ọhu, na olu nwanyi anālu ọhu, na olu nkume-igwe-nri, na ìhè oriọna, lanari ha n'iyì.


Unu egela ha nti; fènu eze Babilon, we di ndu: n'ìhi gini ka obodo a gāghọ nkpọnkpọ ebe?


Otú a ka Jehova siri: Agānu kwa ọzọ n'ebe a, nke unu onwe-ūnu nāsi, Nkpọnkpọ ebe ka ọ bu, nke ọ nādighi madu ma-ọbu anumanu nēbi nime ya, ọbuná n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem, nke bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, nke ọ n'adighi madu, ọ nādighi kwa onye-obibi, ọ nādighi kwa anumanu, nēbi nime ha,


agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ahurum, ma, le, ubi ọma bu ọzara, akwatusi-kwa-ra obodo-ya nile n'iru Jehova, n'iru iwe-Ya di ọku.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Ebe tọb͕ọrọ n'efu ka ala nka nile gābu; ma M'gaghi-eme ka ọ gwusia.


Ewe wusi ọnumam na iwem, o we re ọku n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem; ha we ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe tọb͕ọrọ n'efu, dika o si di ta.


Ndi-okenye akwusiwo inọ n'ọnu-uzọ-ama, Umu-okorọbia akwusiwo ikpọ ubọ-akwara-ha.


M'gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ.


Ihe-ike ebiliwo ibu nkpa-n'aka nke nmebi-iwu; ọ dighi nke gāfodu nime ha, ma-ọbu nime ìgwè madu-ha, ma-ọbu nime ihe-ha: ọkaka adighi kwa n'etiti ha.


M'gēme kwa ka obi-utọ ya nile kwusi, ya na ememe-ya, na ọnwa ọhu ya, na ubọchi-izu-ike-ya, na mb͕e-ya nile akara àkà.


M'gēji kwa ubọchi nile nke Bealim leta ya, bú ndi ọ nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, chiri nb͕a-aka-imi-ya na ihe-ichọ-nma-ya ke onwe-ya, jeso ndi nāhu ya n'anya, ma Mu ka o chezọrọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.


Ma ala nka gāghọ, ebe tọb͕ọrọ n'efu n'ihi ndi bi nime ya, site na nkpuru nke omume nile ha.


ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n'ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n'ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile.


Follow us:

Advertisements


Advertisements