Jeremaya 7:18 - Bible Nso18 Umu-ha nāchikọta nkú, ndi bu nna nāfunwu ọku, ndinyom-ha nāgwọ utu ọka flour koro eko, imere eze-nwanyi nke elu-igwe achicha, na iwusiri chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe. See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a18 Ụmụ na-achịkọta nkụ nke nna ha ji emenye ọkụ, ebe nne ha na-eghe achịcha ha na-eche nʼihu Eze nwanyị mbara Eluigwe. Ha na-awụpụrụ chi ndị ọzọ mmanya nʼihi ịkpasu m iwe. See the chapter |
otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, kwuru, si: Unu onwe-unu na ndinyom-unu ji ọnu-unu ekwu okwu, ọ bu kwa aka-unu ka unu jiworo mezu ya, si, Ayi aghaghi ime nkwa nile ayi nke ayi kweworo, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu: menu ka nkwa nile unu guzosie ike n'ezie, me-kwa-nu ihe nile unu kwere na nkwa n'ezie.
N'ihi na mb͕e M'mere ka ha ba n'ala ahu, nke M'weliri akam elu inye ha, ha we hu ugwu ntà nile ọ bula di elu, na osisi nile ọ bula b͕ara ọhia, ha we chua àjà nile ha n'ebe ahu, nye nkpasu-iwe nke onyinye-ibiaru-nso-ha n'ebe ahu, do ihe-ísì-utọ nile ha n'ebe ahu, wusi àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha n'ebe ahu.