n'ihi na arapuwo ulo-elu; ab͕anariwo ìgwè obodo; Ofel na ulo nche anọchiwo n'ọnọdu ọb͕à rue mb͕e ebighi-ebi, ebe obi-utọ nke inyinya-ibu-ọhia, ebe-ita-nri nke ìgwè aturu di iche iche;
Ma ọ buru na unu egeghm nti ido ubọchi-izu-ike nsọ, na ighara ibū ibu bata n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem n'ubọchi-izu-ike; M'gēsuye kwa ọku n'ọnu-uzọ-ama-ya nile, ọ gērichapu kwa ulo-elu nile nke Jerusalem, agaghi-emenyu kwa ya.
Ewe tipue obodo, ndi-agha nile we b͕apu, pua n'obodo n'abali n'uzọ ọnu-uzọ-ama n'etiti mb͕idi-ya abua, nke di n'akuku ubi eze ab͕ara ogige; (ma ndi Kaldea nānọ imegide obodo buruburu:) ha we je n'uzọ Araba.
Israel echezọwo kwa Onye ahu Nke meworo ya, o we wue ulo uku di iche iche; Juda emewo kwa ka obodo ewusiri ike ba uba: ma M'gēzite ọku n'obodo-ya nile, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.
Ọhù Obadaia. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri bayere Edom: Ayi anuwo ihe-ọnunu sitere n'ọnu Jehova, ezigawo kwa ukọ̀ n'etiti mba nile, si, Bilienu, ka ayi bilie imegide ya n'agha.