Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 51:3 - Bible Nso

3 Ka okwe-uta kwe uta-ya n'ebe onye nēkwe uta nọ, na n'ebe onye nēweli onwe-ya elu n'uwe-agha-ya nọ: unu enwe-kwa-la ọmiko n'aru umu-okorọbia-ya; wezuganu usu-ndi-agha-ya nile ka ebibie ya.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya, ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya. Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ, kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam.

See the chapter Copy




Jeremaya 51:3
12 Cross References  

Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gāchiri umu-gi nāṅu ara tupia ha Na nkume di elu.


Kegidenu inyinya n'ub͕ọ-ala, rikwasinu, unu ndi-inyinya, guzo-kwa-nu onwe-unu nēkpu okpu-agha; richanu ube-unu, yirinu uwe-agha-unu.


Donu onwe-unu n'usoro imegide Babilon buruburu, unu ndi nile ndi nāzọ uta ukwu ikwe ya; b͕anu ya, unu asọlara àkú anya: n'ihi na Jehova ka o mehieworo megide.


Rigo megide ala Merataim, imegide ya, rigo kwa rue ndi bi na Pekod: b͕ue, wezuga kwa ka ebibie n'azu ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me kwa dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu.


Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n'ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha.


Asi na Babilon arigorue elu-igwe, asi kwa na o wusie ebe di elu nke ike-ya ike, ma na Mu ka ndi nāpunara ya ihe gēsi biarue ya aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi na ọnwu arigobatawo na window nile nke ayi, ọ batawo n'ulo-elu nile nke ayi; ibipu umu-ntakiri n'èzí, na umu-okorọbia n'amá nile.


Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí, Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile; Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.


N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.


Follow us:

Advertisements


Advertisements