Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 51:12 - Bible Nso

12 Bulienu ọkọlọtọ n'ebe mb͕idi nile nke Babilon di, menu ka nche sie ike, menu ka ndi-nche guzosie ike, dozienu uju nēru nbì; n'ihi na Jehova ezubewo me kwa ihe O kwuru megide ndi bi na Babilon.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn. Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya. Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha, nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo, bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn.

See the chapter Copy




Jeremaya 51:12
18 Cross References  

Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.


Ọ gēbuli-kwa-ra mba nile ọkọlọtọ, we chikọta ndi Israel achupuru achupu, ndi Juda b͕asara ab͕asa ka Ọ gēsi na nkuku anọ nke uwa kpọkọputa kwa.


Bulienu ọkọlọtọ n'elu ugwu nke osisi nādighi, welierenu ha olu, fenu aka, ka ha we ba n'ọnu-uzọ nile nke ndi amara aha-ha.


Iwe Jehova agaghi-alaghachi azu, rue mb͕e O mere ya, ru kwa mb͕e O mere ka ihe-nzube nile nke obi-Ya guzosie ike: na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia unu gāghọta ya nke-ọma.


N'ihi nka ka uwa gēru újú, elu-igwe nke di n'elu gēji kwa nji: n'ihi na ekwubewom, ezubewom, echègharighkwam, M'gaghi-esi kwa nime ya laghachi azu.


Gosinu n'etiti mba nile, menu ka anuru ya, bulienu ọkọlọtọ; menu ka anuru ya, unu ezobela: sinu, Ewerewo Babilon, emewo ka ihere mee Bel, Merodak atuwo ujọ; emewo ka ihere me arusi-ya nile akpuru akpu, arusi-ya nile atuwo ujọ.


Jehova emeghewo ulo-àkù-Ya, chiputa ihe-agha nile nke oké iwe-Ya: n'ihi na ozi di nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēje n'ala ndi Kaldea.


Muchanu àkú nile; jidesienu ọta nile ike: Jehova akpọtewo mọ nke ndi-eze Midia; n'ihi na imegide Babilon ka nzube-Ya di, ibibi ya: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


Bulienu ọkọlọtọ n'ala ahu, fùanu opì-ike n'etiti mba nile, donu mba di iche iche nsọ imegide ya, menu ka ala-eze, bú Ararat, na Mini, na Ashkenaz, nuru, zukọ imegide ya: menu ka otù ọchi-agha buru onye-nlekọta imegide ya; menu ka inyinya rigota dika igurube di egwu.


Ala ahu we nāma jijiji, nāb͕ali kwa: n'ihi na èchìchè nile nke Jehova megide Babilon eguzosiwo ike, ime ka ala Babilon ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Jehova emewo ihe nke O zubere; O mezuwo okwu-ọnu-Ya nke O nyere n'iwu site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie; Ọ kwadawo, ghara inwe ọmiko: O we me ka onye-iro ṅuria ọṅu n'aru gi, O mewo ka mpi nke ndi nākpab͕u gi di elu.


M'gāchikọta mba nile, me ka ha rida na ndagwurugwu Jehoshafat; Mu na ha gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu bayere ndim na ihe-nketam, bú Israel, ndi ha chusaworo n'etiti mba nile, ọ bu kwa alam ka ha kère.


Onye-nchusa arigotawo n'iru-gi: chebe ebe ewusiri ike, che uzọ nche, me ka úkwù-gi sie ike, b͕a ike ume nke-uku.


O rue, mb͕e eze Ai huru nke ahu, na ndikom obodo-ya mere ngwa, bilie n'isi-ututu, pua izute Israel ibu agha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, na mb͕e akara àkà, n'iru Araba ahu; ma ya onwe-ya amaghi na ndi nēru nbì di megide ya n'azu obodo-ya.


Follow us:

Advertisements


Advertisements