Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 5:23 - Bible Nso

23 Ma ndi nka nwere obi nēwezuga onwe-ya nānupu kwa isi; ha ewezugawo onwe-ha, we la.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe. Ha atụgharịala wezuga onwe ha.

See the chapter Copy




Jeremaya 5:23
14 Cross References  

Ghara kwa idi ka ndi bu nna-ha, Ndi bu ọb͕ọ nēwezuga onwe-ha nke nānupu kwa isi; Ọb͕ọ ndi nēdozighi obi-ha, Ndi mọ-ha nēkwesighi ntukwasi-obi n'ebe Chineke nọ.


Ọgu arọ abua ka M'nāsọ ọb͕ọ ahu oyi, M'we si, Ndi nke nākpafu n'obi-ha ka ha bu, Ha onwe-ha amaghi kwa uzọm nile:


N'ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike.


Laghachikutenu Onye ahu Nke umu Israel siri n'aka-Ya wezuga onwe-ha nke-uku.


Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?


Dika ndi nēdebe ubi, otú a ka ha nọ nēmegide ya buruburu; n'ihi na Mu ka ọ nupuworo isi n'okpuru, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ka M'jekuru ndi uku, gwa ha okwu; n'ihi na ndi ahu mara uzọ Jehova, na ikpé nke Chineke-ha. Ma ndi ahu ab͕ajiwo yoke n'otù, tijie ab͕u nile.


Ha nile bu ndi nēwezuga onwe-ha nke-uku, nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ: ọla na ígwè ka ha bu: ndi ahu nile bu ndi-nbibi.


N'ihi na ndim nākwughari efekefe n'obi idaghachi azu site n'ebe M'nọ: ọ bu ezie na Onye nke nọ n'elu ka ha nākpọ ha ibiakute, ma ọ dighi otù onye efu gēbuli onwe-ya elu.


Nmehie ndim ka ha nēri, ọ bu kwa ajọ omume-ha ka ha nēbuli, onye ọ bula nkpuru-obi-ya, nye.


Ahuhu diri obodo nke nēnupu isi, nke ruwo-kwa-ra árú, obodo ahu nke nēme ihe-ike!


Mb͕e nwoke nwere nwa-nwoke nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, nke nāgaghi-ege nti n'olu nna-ya, na n'olu nne-ya, ha we dọ ya aka na nti, ma ọ geghi ha nti:


N'ihi na mu onwem amawo nnupu-isi-gi, na nkwesi-olu-ike-gi: le, mb͕e m'nānọ ndu n'etiti unu ta, unu aburuwo ndi nānupu isi n'okpuru Jehova; ùnu gēsi aṅa ghara inupu isi kari nke-uku mb͕e ọnwum gasiri?


Lezienu anya, umu-nnam, ka ajọ obi nke ekweghi-ekwe ghara idi nime onye ọ bula n'etiti unu ma eleghi anya, n'iwezuga onwe-ya n'ebe Chineke di ndu nọ:


Follow us:

Advertisements


Advertisements