Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 49:3 - Bible Nso

3 Kwasie ákwá ike, gi Heshbon, n'ihi na apunarawo Ai ihe-ya; tienu nkpu, unu umu-ndinyom nke Raba, kenu ákwà-nkpe n'úkwù: tienu aka n'obi, b͕aghari-kwa-nu n'ogige nile unu; n'ihi na Malkam gāla n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 “Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai! Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba! Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ; gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu, nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha, buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ.

See the chapter Copy




Jeremaya 49:3
28 Cross References  

O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Devid zigara Joab, ya na ndi-orù-ya, na Israel nile; ha we bibie umu Amon, nọchigide kwa Raba n'agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem.


n'ihi na ha arapuwom, kpọ isi ala nye Ashtoret, bú chi ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú chi Moab, nye kwa Milkom, bú chi umu Amon; ha ejeghi kwa ije n'uzọm nile, ime ihe ziri ezi n'anyam, na idebe ukpurum nile na ikpém nile, dika Devid, bú nna-ya, mere.


Solomon we jeso Ashtoret, bú chi ndi Zaidon, jeso kwa Milkom, bú ihe-árú ndi Amon.


Ebe nile di elu nke di n'iru Jerusalem, nke di n'aka-nri ugwu nbibi, nke Solomon, bú eze Israel, wuru nye Ashtoret, bú ihe-árú ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú ihe-árú Moab, nye kwa Milkom, bú ihe-árú umu Amon, eze meru-kwa-ra ha.


Ndikom Bet-el na Ai, ọgu iri-na-otù na atọ.


kwasienu ákwá ike; n'ihi na ubọchi Jehova di nso; dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.


Kwasie ákwá ike, gi ọnu-uzọ-ama; tie nkpu, gi obodo; i b͕azewo, Filistia, ka i ra; n'ihi na n'Ugwu ka anwuru-ọku si bia, ọ dighi kwa onye ọ bula nēguzo iche na mb͕e-ya nile akara àkà.


Ọ rigowo n'ulo, ọbuná Dibon, n'ebe-ya di elu, ikwa ákwá: n'aru Nebo na n'aru Medeba ka Moab nākwasi ákwá ike: n'isi-ha nile ka nkwọcha-isi di, afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo.


N'ihi nka ka Moab gākwasiri Moab ákwá ike, ọ gākwasi ákwá ike, ka ọ ra: iri mbadamba nkpuru-vine nke Kia-hareset ka unu gātamu ntamu, ebe unu bu nání ndi apiaworo ihe.


Ibu eboro Taia. Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish; n'ihi na ebibiwo ya, ulo we ghara idi ya, uzọ-nbata ghara kwa idi ya: esiwo n'ala Kitim kpughere ha ya.


Gabiganu rue Tashish; kwasienu ákwá ike, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu.


N'ihi nka kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tienu aka n'obi, kwasi kwa ákwá ike: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova esighi n'aru ayi laghachi.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iji nmehie-ha leta Amon nke No, leta kwa Fero, leta kwa Ijipt, leta kwa chi-ya nile, leta kwa ndi-eze-ya; ọbuná Fero, na ndi nātukwasi ya obi:


Ọ dighi kwa otuto Moab di ọzọ; nime Heshbon ka ha chèputara èchìchè ọjọ megide ya, si, Bianu, ka ayi bipu ya ka ọ ghara ibu mba. Gi Madmen, agēme kwa ka i dere du; gi ka mma-agha gējeso.


Emewo ka ihere me Moab; n'ihi na ọ tuwo ujọ: kwasie ákwá ike ti kwa nkpu; gosinu ya n'Anon, na emebiwo Moab.


N'ihi na isi nile ọ bula kwọchara akwọcha, ọ bu kwa afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo: n'aka nile ka obibì-mma dikwasi, n'úkwù nile ka ákwà-nkpe di kwa.


N'ihi na ọ bu n'ihi na i tukwasiwo obi-gi n'ọlu-gi nile na n'àkù-gi nile ka agēwere kwa gi onwe-gi: Kemosh gāpu kwa so ndi gēje biri n'ala ọzọ, na ndi-nchu-àjà-ya na ndi-isi-ya n'otù.


Nke diri umu Amon. Otú a ka Jehova siri: Ọ̀ dighi umu-ndikom Israel nwere? ọ̀ dighi onye-nnweta ihe-ya o nwere? Gini mere Malkam ji nweta Gad, ndi-ya we biri n'obodo-ya nile?


Na mberede ka Babilon daworo, ewe tipia ya: kwasierenu ya ákwá ike; werenu balm bayere ihe-nb͕u-ya ma eleghi anya agāgwọta ya.


Ada nke ndim, ke ákwà-nkpe n'úkwù-gi, turua onwe-gi na ntu: mere onwe-gi oruru-újú dika nke nwa-nwoke enwere nání ya, bú iti-aka-n'obi di ilu nke-uku; n'ihi na ọ bu na mberede ka onye nāpunara madu ihe gābiakwasi ayi.


eze-ha gāla kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya onwe-ya na ndi-isi-ya n'otù; otú a ka Jehova siri.


na ndi nākpọ isi ala nye usu ihe nile di n'elu-igwe n'elu-ulo nile; na ndi nākpọ isi ala, ndi nāṅuru Jehova iyi, ndi ji kwa Malkam aṅu iyi;


Genu nti, unu ndi-ọgaranya, kwa ákwá, ti-kwa-nu nkpu n'ihi ihuju-anya nile unu nke nābiakwasi unu.


Joshua we si na Jeriko ziga ndikom ije Ai, nke di nso Bet-even, n'akuku Iru-anyanwu nke Bet-el, o we gwa ha okwu, si, Rigonu, ledo ala ahu. Ndikom ahu we rigo, ledo Ai.


Jehova we si Joshua, Atula egwu, atu-kwa-la ujọ: chiri ndi-agha nile tiyere onwe-gi, bilie, rigorue Ai: le, enyewom eze Ai, na ndi-ya, na obodo-ya, na ala-ya, n'aka-gi:


Joshua we sure Ai ọku, do ya ka ọ buru obo ebighi-ebi, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, rue ta.


Follow us:

Advertisements


Advertisements