M'gēme kwa ka ndi-ikpe-gi laghachi dika na mbu, M'gēme kwa ka ndi nādu gi ọdu laghachi dika na nmalite: emesia agākpọ gi Obodo ezi omume, obodo nke kwesiri ntukwasi-obi.
Obodo a gāghọ-kwa-ram aha obi-utọ, na otuto, na ima-nma, diri mba nile nke uwa, ndi gānu ezi ihe ahu nile nke Mu onwem nēmere ha, ndi gātu kwa oké egwu ma jijiji n'ihi ezi ihe ahu nile na n'ihi udo ahu nile nke Mu onwem nēmere ya.
Ọ dighi kwa otuto Moab di ọzọ; nime Heshbon ka ha chèputara èchìchè ọjọ megide ya, si, Bianu, ka ayi bipu ya ka ọ ghara ibu mba. Gi Madmen, agēme kwa ka i dere du; gi ka mma-agha gējeso.
Le ka esi tipia ya nke-uku! ha akwasiwo ákwá ike. Le ka Moab si b͕akuta azu n'ihere nke-uku! Moab aghọwo-kwa-ra ndi nile di ya buruburu ihe-ọchì na ihe-itu-ujọ.
ka ha nēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n'ihi na n'otù oge hour ka ikpé-gi biara.