Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 48:12 - Bible Nso

12 N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēzigara ya ndi nērulata ite manya-vine, ha ewe rulata ya; ọ bu kwa ihe manya-vine ya nile ka ha gāb͕apu, ọ bu kwa ite nile ha ka ha gātupia.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite, ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.

See the chapter Copy




Jeremaya 48:12
14 Cross References  

I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha; Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha.


O gēru kwa na, dika anu-ufe nke nēfefu efefu, dika akwu-nnunu achusara achusa, otú a ka umu-ndinyom Moab gādi na ngabiga-miri diri Anon.


Ọ gētiwa kwa ya dika esi etiwa ite ndi-ọkpu-ite nākpu, nke etipiara etipia, Ọ gaghi-enwe ọmiko: ewe ghara ichọta n'etiti ntipia-ya otù ejùjù iji guru ọku n'okpukpo-ntu, ma-ọbu iji kupu miri n'ọdọ-miri.


Ndi-ebube-ha ezigawo ndi-ntà-ha ichuta miri: ha abiaruwo olùlù-miri nile, ha achọtaghi miri; ha alatawo n'ite efu: ihere emewo ha, etiyewokwa ha n'ọnọdu-ihere, ha ekpuchiwo kwa isi-ha.


I gētiwa kwa karama ahu n'anya ndikom ahu, bú ndi nēso gi je,


Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu: n'ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M'gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike.


le, M'gaje iziga chiri ab͕uru nile nke Ugwu, (ọ̀ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa Nebukadreza, bú eze Babilon, bú orùm, ka M'gēzigara ozi, M'gēme kwa ka ha bia imegide ala nka, na imegide ndi bi ya, na imegide mba nile ndia nọ ya buruburu; M'gēwezuga kwa ha ka ebibie ha, M'gēme kwa ha ka ha ghọ ihe-iju-anya, na ihe-ima-ọsọ, na nkpọnkpọ ebe di mb͕e ebighi-ebi.


Onye nānọ jū ka Moab bu site na mb͕e ọ di na nwata, ọzọ, manya-vine doro edo ka ọ bu, esighi kwa n'otù ihe b͕aye ya n'ihe ọzọ, o jeghi kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ: n'ihi nka ka utọ-ya guzoworo nime ya, ísì-ya ab͕anweghi kwa.


Ihere Kemosh gēme kwa Moab, dika ihere Bet-el, bú ihe-ntukwasi-obi-ha, mere ulo Israel.


Emebiwo Moab, obodo-ya nile akwugowo kwa n'anwuru-ọku umu-okorọbia-ya arọputara arọputa aridawo kwa n'ob͕ub͕u, ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


N'elu-ulo nile nke Moab na n'amá-ya nile, n'ebe nile ọ bula, ka iti-aka-n'obi di: n'ihi na etiwawom Moab dika ihe nātọghi utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Onye nāpunara madu ihe gābiaru kwa obodo nile ọ bula, ọ dighi kwa obodo ọ bula gēwepuga onwe-ya; ndagwurugwu gāla kwa n'iyì, agēme kwa ka ala di lari tọb͕ọrọ n'efu; dika Jehova siri.


N'ihi na Jehova neme ka nbili-elu nke Jekob lata, dika nbili-elu nke Israel: n'ihi na ndi-nwusi awusiwo ha dika miri, ọ bu kwa ngalaba-vine nile ha ka ha bibiworo.


Follow us:

Advertisements


Advertisements