Jeremaya 48:11 - Bible Nso11 Onye nānọ jū ka Moab bu site na mb͕e ọ di na nwata, ọzọ, manya-vine doro edo ka ọ bu, esighi kwa n'otù ihe b͕aye ya n'ihe ọzọ, o jeghi kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ: n'ihi nka ka utọ-ya guzoworo nime ya, ísì-ya ab͕anweghi kwa. See the chapterBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a11 “Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị, ọ dịka mmanya doro edo, nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ, o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe, isisi ya agbanwekwaghị. See the chapter |