Biblia Todo Logo
Online Bible

- Advertisements -




Jeremaya 46:23 - Bible Nso

23 Ha gēb͕utu oké ọhia-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na agaghi-eleputa ya; n'ihi na ha di ọtutu kari igurube, ha adighi kwa ọnu-ọgugu.

See the chapter Copy

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke. Ha dị ọtụtụ karịa igurube, a pụghịkwa ịgụta ole ha dị.

See the chapter Copy




Jeremaya 46:23
8 Cross References  

Ọ gēme kwa nsọpuru nke oké ọhia-ya na nke ubi ọma ya ka ọ gwusia, ma nkpuru-obi ma anu-aru: ọ gādi kwa ka ọtita-aru nke onye-ọria.


M'gēwere kwa nmehie-unu leta unu dika nkpuru omume nile unu si di, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): M'gēsuye kwa ọku n'oké ọhia-ya, ọ gērichapu kwa ihe nile di ya buruburu.


Olu-ya di ka mkpatu agwọ mb͕e ọ nāga; n'ihi na ha gāchiri usu-ndi-agha je ije, ha achiriwo kwa anyu-ike biakute ya, dika ndi-ọwa-nkú.


Nwa nke madu, che iru-gi n'uzọ Ndida, me ka okwu-gi busa dika miri-ozuzo n'ebe Ndida di, bue amuma megide oké ọhia nke ọhia ahu di na Negeb;


M'gākwughachi kwa unu arọ nile nke igurube na ukpala na ọbubu na palmer-worm riworo, bú oké usu-ndi-agham nke M'zitere n'etiti unu.


N'ihi na ha na anu-ulo-ha na ulo-ikwū nile ha rigoro, ha batara dika ojuju igurube n'iba-uba; ọnu-ọgugu adighi kwa ha, ọ dighi kwa camel-ha: ha we bata n'ala ibibi ya.


Ma ndi Midian na ndi Amalek na umu Iru-anyanwu nile nāmade nime ndagwurugwu ahu dika igurube n'uba; iguta-ọgugu adighi kwa camel-ha, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba.


Follow us:

Advertisements


Advertisements